You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasi taa: Okorocha na Arch. katọlik Owerri
Gọvanọ Okorocha a maala Katọlik bishọp nke Owerri Diocese, bụ Anthony Obinna aka mgba.
Okorocha gwara Arch Bishop sị, ihe ọsọkwara ya mee na o nweghị ike ịtụkwasa onye patị APGA n'isi ndị Imo ka ọ chịa ha.
Okorocha sịrị na Arch Bishọp siri onwe ị maja ya na ozi Easter ya.
Aka enwe n'ofe ndọrọndọrọ ọchịchị 2019
Adọla ndị ntaakụkọ aka na ntị ka ha kpachara anya maka ndị otu ọjọọ na-achọ ịkponye aja na garrị ntụliaka ọchịchị nke 2019.
Garba Shehu bụ ojeozi mgbasa ozị onyeisiala gwara ndị isi ọrụ ntaakụkọ nke a ụnyaahụ mgbe ọ sị na enyopula aka enwe n'ofe ya bụ ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019.
Russia achụọla ndị nọchiteanya US iri isii na mbọrọ ọbọ
Mba Russia ekwuola na memmegwara anaghị ese okwu.
Russia asịla mmadụ iri isii ndị nnọchiteanya mba US ha kwara ngwongwo ha laa iji bọrọ ọbọ ihe US mere ha.
N'egwuregwu
A họpụtala Liverpool na Manchester United na otu egwu bọlụ ga-esọ kwakọrịta mpị na egwuruegwu iko International Championship.
Real Madrid, AC Milan na Juventus ga-eso sọọ ya bụ mpi nke a na-atụ anya a ga-agba na Michigan US n'ọnwa July.
Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji
Ihe nkiri nke taa
Ụzọ atọ nwaanyị sị kwesi idozi onwe ya.