Ndị Enugwu enwetala ọkaikpe ọhụrụ

Gọvanọ Enugwu steeti eduola ụmụnwaanyị ato n'iyi ọrụ dịka ndị ọkaikpe.
Ụmụnwaanyị atọ bụ ndị gnọvanọ na-achi Enugwu steeti duru n'iyi ọrụ tata dika ndị ọkaikpe.

Ndị ọkaikpe ọhụrụ ahụ bụ Linda Okaibe, Vera Ajogwu na Nnenna Alukwu.
Oge ọ na-edu ha na ya bụ iyi ọrụ tata, Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi gwara ha ka ha were amamihe ọtụtụ afọ ha niile wee hụ na usoro ikpe na-aga ọsọ ọsọ n'Enugwu steeti.

Govano Ugwuanyi kwuru na n'ime mmadu asatọ e wegara aha ha na nke ndị otu 'Nigerian Judicial Council NJC', nani mmadụ atọ a bu ndi gafere na nyocha ndi otu ahụ mere.
Okaikpe Nnenna Alukwu, Vera Ajogwu nakwa Linda Okaibe ṅụrụ iyi ma kwekwaa nkwa na ha ga-arụ ọrụ ha nke ọma.





