You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
N'Enugwu, onye NSCDC egbuola mmadụ atọ n'Enugwu
Ihe dịka mmadụ atọ bụ ndị nwụrụ anwụ oge onye ọrụ nchekwa nke akpọrọ NSDC n'aha ịchafụ gbara egbe ụgbọala ha nọ n'ime ya.
Akụkọ kwuru na ihe ọdachi a mere na Miliki Hill dị na Ngwo n'Enugu steeti.
Ụgbọala ahụ nwuru ọkụ ma dakwasị ndị njem.
Mgbe onye ntaakụkọ BBC kpọrọ ọnụ na- ekwuru ndị uweojii na Enugu steeti bụ Ebere Amaraizu, o kwuru n'ezie na ya bụ ihe mere.
Ma kwukwa na ha na-enyocha ya ihe mere.
"Anyi nwetara ozi na onye civil defensi agbaguru ndị mmadụ na Miliki Hill dị n'Engwu. Anyi na-enyocha ya."