You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ego ole ka ndị ụlọikpe na-eri?
Onye sinetọ na-anọchite ndị Kaduna Sentraal bụ Shehu Sani ekwupụtala na a na-akwụ ha ihe ruru ego nde naịra 13.5 kwa ọnwa ha ji arụ ọrụ.
Mana Sani kwuru na ego ahụ agunyeghị puku narị naịra asaa bụ ụgwọ ọnwa a na-akwụ ha.
O kwuru na a kpọghị ego ahụ aha mana e nyere ha iwu iweta akwụkwọ ego ọbụla ha mefuru si n'ọnụ ego nde naịra 13.5 ahụ.
Nke a ebutela akụkọ n'akụkụ dị iche iche dịka ndị mmadụ na-ekwu na ego ahụ karịrị akarị.
Ndị otu na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na bekee kwuru na ego ahụ karịrị akarị, ebe ego ekewapụtara maka ndị ọrụ bụ naanị puku naịra iri na asatọ (N18,000).
Fidelis Edeh bubu osote onyeisi ndị NLC kwuru na ọnọdụ a bụ ihe na-agba anya mmiri maka na ọ dịka ka ha a nọrọ onwe ha.
N'okwu ya: "Nke a o kwukwara abụghị ebe ahụ ka o bere, a na-akwụkwa ha ego iji rụọ ọrụ maka ndị ha na-anọchite.
"Mana onye ọbụla makwa na ọ bụ ha na-ahazi etu a ga-esi mee ya mana ị ga nime obodo ebe ha kwesiri ịrụ ọrụ ahụ, onweghi ihe ị ga-ahụ."
Ọtụtụ ndị mmadụ na-etinye ọnụ n'okwu a kwuru na ndị sinetọ anaghị etinye uche na iwelite ego ụgwọ ndị ọrụ mana ọ bụ naanị onwe ha ka ha na-elegara anya.
I mara ego ole a na-akwụ ndị ọchịchị Naịjirịa?
Edemede a si n'aka ndị RMAFC- http://www.rmafc.gov.ng/
Ilebe anya na mpaghara mba ụwa ndị ọzọ, Naịjiria na-emefu ego n'ọchịchị karịa mba ụwa ndị ọzọ ọbụla.
Otela ndị mmadụ na-ajụ ego ole a na-akwụ ndị ọchịchị mana, ngosipụta sinetọ Sani ekpughele ihe ezoro ezo.
Ego ole ka mba ndị ọzọ na-emefu n'ọchịchị?
Edemede a si: Arabian Journal of Business and Management Review(OMAN Chapter) Vol. 4, No.5: December 2015.
Nke a gosiri na Naịjiria kacha mba ndị ọzọ niile n'ụwa akwụ ndị ọchịchị ụgwọ ọnwa.
Ọnọdụ a adịghịkwa ọtụtụ ndị Naịjiria mma n'obi.