You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Naịjirịa na Ghana: Onye ga-enyere ibe ya aka ịlụso mpụ ọgụ?
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na Naịjirịa ga-enyere mba Ghana aka na-iluso mpụ ọgụ.
Buhari kwuru nke a taa oge ọ gwara ndị Ghana okwu maka mmemme ncheta ụbọchị nnwereonwe ha ha mere taa.
N'okwu ya, Buhari kwuru na ya ga-enyere Ghana aka iluso mpụ ọgụ.
Mana ajụjụ nọ ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ bụ etu Naịjirịa ga-esi nyere Ghana aka ebe akwụkwọ ndị otu Amnesty International depụtara gosiri na Ghana ka Naịjirịa mma n'ihe gbasara mpụ.
N'akwụkwọ nke afọ a, Naịjirịa nọ n'ogo 148 nime mba 180 n'ụwa niile ebe Ghana nọ n'ogo 80. Nke a pụtara na agbanyeghi agha gọọmenti etiti na-ebuso mpụ, Naịjirịa ka nwere mpụ nke ukwu.
BBC Igbo gbara onye nnọchi anya otu Amnesty International Auwal Musa Rafsanjan ajụjụọnụ gbasara ihe Onyeisiala Buhari kwuru.
Auwal kwuru na mmadụ agaghị enyeli ihe ọ na-enweghi. Ọ kọwara na ọnọdụ mpụ na Naịjirịa nọ n'ogo dị elu, nke a kpatara na ọ gaghị enyenwuru mba ọzọ aka ịchụ mpụ.
Gere ihe o kwuru ebe a:
Cheta na ndị mba Afịrịka mere onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari onye ndu na ibuso mpụ agha maka agha ọ na-ebuso mpụ na Naịjirịa.