You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihere e mela ndị amụma ụgha -John Odigie Oyegun
Parti nọ na ọchịchị bụ APC a dọtiala oge ọchịchị onye isi 'National working commitee' ruo otu arọ.
Ha mere nka na nzụkọ NEC ha mere taa.
Gọvanọ Kogi steeti bụ Yahaya Bello,kwuru na ndọtị a ga-amalite na ọnwa June iri atọ.
O kwuru na ha zukọrọ ka ha nwee nkpebi dabara n'iwu partị ha.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Ọ sịkwa na oge ọchịchị ndị nọ na ọkwa 'National working commitee' ga-abịa na njedebe n'ọnwa June iri atọ nke arọ 2018.
N'etufughị oge John Odigie-Oyegun ekwuola na ya bụ nkpebi ị dọtị oge ọchịchị ya echiela ndị amụma ụgha kwuru na aga-ewepụ ya ihere n'ihụ.
O kwukwara na mkpebi a bụ ihe dị utọ ma makwa mma.
O boro ndị ntaakụkọ ebubo sị na ha ghatọkọ ihe gbasara parti ya.
Odigie-Oyegun sị na akụkọ kwuru na ya bụ nzụkọ kpara maka ụbọchị ọ ga-apụ dịka onyeisi bụ asị.