Gọọmenti akagbuola nzukọ FEC nke izuụka a

Agaghị eme nzukọ ndị ọchịchị Naịjirịa a na-akpọ 'Federal Executive Council' (FEC) nke izuụka a.

Onye na-ekwuchịtere onyeisiala Buhari bụ Femi Adesina gwara ndị ntaakụkọ taa,na onyeisiala bụ Muhammadụ Buhari na ọtụtụ mịnịsta ya ga- eje mmeme a ga-eme na Transcorp Hotel dị na Abuja na Wenesde bụ ụbọchị ekwesiri ime nzụkọ a.

Adesina kwuru n'akwụkwọ mgbasaozi o zipụru sị,"Nzukọ FEC agaghị adị na ụbọchị Wenesde, ọnwa Febụwarị 28, nke afọ 2018."

"Ọ bụ maka na onyeisiala na ndị mịnịsta ya nwere nnukwu mmeme nke a kpọrọ 'International Conference on Lake Chad Basin,' n'ụlọ nkwari, Transcorp Hilton, dị n'Abuja.

Ha ga-anọ ogologo oge ebe ahụ."

Ndị ọchịchị gọọment a na-akpọ FEC na-agbakọ kwa Wenesde n'Abuja. Ndị na-eso na ọgbakọ a bụ ndị mịnịsta, ndị gọvanọ na ndị chibụrụ Naịjirịa dị ka onyeisiala.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: