Yobe steeti: Ndị agha agbapụtala ụmụakwụkwọ ndị a tọrọ

Dịka Gọọmenti Yobe Steeti siri kwue, ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị karịrị iri ise na-efu efu ka ndị e chere na ha bụ Boko-Haram wakpochara ụlọakwụkwọ GGSTC nke dị na Dapchi na steeti ahụ ụbọchị Monde

Akwụkwọ ọzi ọnụ na-ekwuchitere Steeti ahụ bụ Abdullahi Bego wepụtara kwuru na ndị agha ala anyị zọpụtara ụmụakwụkwọ e kwughị ọnụọgụgụ ha n'aka ndị oyiegwu tọrọ ha n'abalị ụnyaahụ.

Bego gara n'ihu kwue na ụmụakwụkwọ ndị ahụ azọpụtara nọ n'aka ndị agha ala anyị.

Ọ sịrị: "Ụmụaka ụmụnwaanyị ndị a azọpụtara nọ n'aka ndị agha Naijiria. Anyi ga-ewepụta nkọwa ole ha dị na ọnọdụ ha ma oge rue."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Onye ntaakụkọ BBC bụ Chris Ewokor kwuru na o dobeghị anya ma ọ bụ ụmụaka niile na-efu efu ka a chọtara, ebe ụmụakwụkwọ na-aga akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ahụ ruru otu puku.

Ma ka osi na dị, onyeisiala Naijiria bụ Muhammadụ Buhari enyela ndị agha iwu ka ha mee gbanụgbanụ ga chekwa ụlọakwụkwọ ahụ.