You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Innoson agbala akwụkwọ ka uweojii ghara ịnwụchi ya
Onye nwe Innoson Motors, bụ Innocent Chukwuma, agbala akwukwo n'ụlọikpe ukwu dị na Lagos ka a ghara ịnwụchịe ya dị ka ụlọikpe nyere iwu izu gara aga.
N'ụbọchị Fraide gara aga, Jọstis Mojisola Dada nyere iwu ka anwụchie nwa amadị ahụ bụ ojiegoachụego n'ihi na ọ biaghị n'ụlọikpe ụbọchị a kara ikpe maka ebubo mpụ na ime akwụkwọ adigboroja eboro ya.
Mana n'ụlọikpe mkpegharị nke dị na Lagos, Chukwuma rịọrọ ka edota n'akụkụ iwu ahụ ụlọikpe nke mbụ nyere.
Ọkaikpe nọchitere Chukwuma bụ Joseph Mbadugha, gwara ụlọikpe na enyeghị Chukwuma akwụkwọ ịkpọ oku bịa ụlọikpe.
Akụkọ a ka na aputa, anyi ga ewetere ụnụ ozi ọzọ banyere ya.