Queen Elizabeth II: Ndị bụbu praịm minista echetala ọchịchị Ezenwaanyị

Queen Elizabeth II

Ebe foto si, PA Media

Ndị rụrụ ọrụ dịka praịm minista mba UK n'oge ọchịchị Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ na-echeta ndụ ọpụrụiche ya.

E nweela praịm minista 15 chịrị mba UK kemgbe Ezenwaanyị rigoro n'oche eze n'afọ 1952.

Ya na ndị praịm minista ya na-akpa kwa mgbe ma na-enwe nzukọ kwa izu, ebe ha na-enye ya ozi ndị dị mkpa maka mba ha.

N'ime ndị rụrụ ọrụ praịm minista n'afọ 70 Ezenwaanyị chịrị, isii akọọla ihe ha na-echeta maka mmekọrịta ha na eze kachasị nọtee aka n'ọchịchị na mba UK.

Sir John Major, praịm ministasite n'afọ 1990 ruo 1997

Ezenwaanyị na John Major

Ebe foto si, PA Media

Sir John gwara BBC na "ọ na-echeta ọtụtụ ihe" gbasara nzukọ ha "dị iche n'ihe ọtụtụ ndị mmadụ nwere ike iche".

"E nwere ọtụtụ ntụrụndụ n'ime ha, e nwere ọtụtụ akpamọchị n'ime ha, e nwere ọtụtụ ịgba asịrị n'ime ha.

"Echere m na ọ ga-atụ ndị mmadụ n'anya nke ukwuu ma ọ bụrụ na ha mara ụdịrị ihe Ezenwaanyị ma maka ndụ ndị maadụ na mpaghara United Kingdom dị iche iche. Enweghi ụdịrị ihe a na-agwaghị ya.

"Gbasara ihe na-eme na mba ofesi, ọ na-ekwukarị na e nwee onyeisiala mba ofesi na-enye nsogbu, 'ezutere m ya ọtụtụ afọ gara aga' maọbụ 'ama m nna ya'. Oge ọbụla ka ọ na-enye okwu amamihe. Nzukọ ndị ahụ Ezenwaanyị na praịm minista na-enwe na-abụkarị ihe kacha mma na-eme n'izu ahụ."

Sir Tony Blair, praịm ministasite n'afọ 1997ruo2007

Ezenwaanyị na Tony Blair

Ebe foto si, PA Media

Sir Tony kwuru na Ezenwaanyị "bụ ihe niile anyị ji akpa nganga ịbụ ndị Briten" ma cheta ihe ndị ọ ma maka ya oge ọ bụ nwaokorobịa.

"Ezenwaanyị bụ otu onye m ma na ndụ m kemgbe m dị ndụ. Site mgbe m fere ọkọlọtọ m ka m na-elele ya mgbe m bụ nwatakịrị, ka e bu ya n'ụgbọala agafe n'ụzọ Durham, ruo mgbe m rụụrụ ya ọrụ dịka praịm minista, ruo nzukọ ikpeazụ mụ na ya nwere nakwa nri mụ na ya rikọrọ na Windsor Castle n'emume Garter e mere naanị ọnwa ole gara aga, ọ bụ ihe mgbaama ikike na-agbanweghi agbanwe.

"Mgbe ahụ anyị rikọrọ nri, anọ m ya nso ọ na-emuke emuke ka anyị na-akpa - na-akpa ọchị ma jupute n'amara.

"Ọ bụghị naanị ugwu ka a na-akwanyere ya, a hụrụ ya n'anya. A na-akwanyere ya ugwu n'ihi agwa ya gụnyere ime ihe iwu ji ya ime na ịkwesị ntụkwasị obi nke o mere ọfụma. A hụrụ ya n'anya n'ihi ịhụnanya na ọmiiko o gosiri anyị."

Gordon Brown, praịm ministasite n'afọ2007ruo2010

Ezenwaanyị na Gordon Brown

Ebe foto si, PA Media

Maazị Brown gwara BBC na ihe Ezenwaanyị masịrị ndị mmadụ n'ihi etu o si eme ihe iwu ji ya ime nakwa ihe ndị ọzọ.

"Ọ na-agbasi mbọ ike, o nwere obi ọmịiko, ihe na-emetụ ya n'obi, ọ maka etu e si akpa mmadụ ọchị. Ọ naghị adị ya ọsịsọ ọbụladị mgbe a na-akpa maka ihe na-atụ ụra na bọjeetị. Mana nke kachasị nke si n'ime ya nwupute ihe bụ etu o si buru ihe gbasara mba a na iwu mba a n'isi.

"Ọ bụ mbaụwa niile na-eru uju n'ihi na ọ bụ onye obi ebere na onye na-ebu ọrụ n'isi nke na-enweghi onye na ga-echefuli ọrụ ndị ọ rụrụ.

"Ọ bụ okpeudo, ọ na-akpọkọta ndị mmadụ ọnụ, na-ege ndị mmadụ ntị. O nweghi ike ịgwa gị uche ya n'ihe ọbụla na-ebute nkewa. Ọ chọrọ ka ndị mmadụ bịakọta ọnụ."

David Cameron, praịm ministasite n'afọ2010ruo2016

Ezenwaanyị na David Cameron

Ebe foto si, PA Media

N'ozi o ziputere, Maazị Cameron kwuru na Ezenwaanyị bụ "agbanwe agbanwe nọ na ndụ anyị kemgbe afọ 70 gara aga" ma kọwaa etu ihe gbasara nkwurita okwu mba na mba si doo ya anya.

"Dịka eze kacha chitee aka anyị nwere, ezi ọchịchị ya anọọla, nye ọtụtụ ndị, ndụ anyị niile - anyị amaghị ihe ọzọ. N'ime afọ iri asaa ahụ, ọ bụ nkume siri ike nye mba anyị nakwa otu Commonwealth.

"E nweghi ihe nkọwa ọzọ na-egosi uchu n'ọrụ karịa ya, o ruuru anyị ibunye ya nkwanye ugwu anyị niile maka ọrụ ọ rụrụ, ibi ndụ ya kwa ụbọchị n'elu iyi ọ ṅụrụ n'ụbọchị ọ gbara afọ 21. E nweghi ihe e ji atụnyere uchu o tinyere na mba anyị, nke bụ na ọ na-ahapụrụ anyị ihe ncheta ga-anagide.

"Ọ bụ, kwa izu, ihe ugwu na enwere m ohere pụrụ iche ka mụ na Ezenwaanyị Elizabeth nọrọ ala n'ime ụlọ ma nwee ikike ịkpọku ya maka ndụmọdụ na amamihe pụrụiche. Ọ bụ ihe ugwu na m nwere ohere ịkpọku amamihe onye ọrụ kacha pụọ iche n'ụwa nakwa n'ezie onye na-ekwuchitere ọha kacha nwee ahụmihe n'ụwa."

Theresa May, praịm ministasite n'afọ2016ruo2019

Ezenwaanyị na Theresa May

Ebe foto si, PA Media

Oriakụ May gwara BBC na izute Ezenwaanyị kwa izu bụ "nnukwu ihe ugwu" nye ya, kwuo na ọ bụ "ezigbo onye nlekọta ọbịa" chọrọ "ime ka ndị mmadụ mesapụ ahụ".

"N'ezie anyị anaghị ekwuli ihe mere maọbụ ihe a kpara na nzukọ ndị ahụ. Mana ọ bụ mkparịtaụka, mkparịtaụka nke gị na mmadụ nwere nnukwu amamihe na nghọta ihe ndị na-eme.

"Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị kpọmkwem ụdịrị uchu n'ọrụ Ezenwaanyị na-etinye n'akpati uhie ya, ịghọta okwu a kpụ n'ọnụ, ihe na-eme na gọọmentị nakwa na gburugburu mbaụwa.

"Mana nke kachasị nke bụ na n'ime ndị isi ọchịchị, ndị isiala m zutere, Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ bụ onye kacha bụrụ echefu echefu."

Boris Johnson, praịm ministasite n'afọ2019ruo2022

Ezenwaanyị na Boris Johnson

Ebe foto si, PA Media

Maazị Johnson kwuru n'ozi o ziputere na Ezenwaanyị "ji nwayọ nwayọ na ọmiiko" bụrụ "ọdinihu na ndịnotu mba anyị".

"Anyị na-echeta amamihe ya dị omimi, na nghọta ya dị egwu, na ike agwụ agwụ ya ma a bịa n'ihe gbasara ịrụ ọrụ ya.

"Ezughi ike dịka akwụkwọ ndebanye ya gaara na-eche, enweghi ụbọchị o gosiri ya ma otu, ruo emume puku kwuru puku - oke na nta - o ji ịchị ọchị ya nakwa ịkpa ọchị ya abịa - nakwa etu o si gbasaa ihe iribeama e ji mara ya n'ebe ọ na-achị n'ime afọ 70 na-enweghi onye ga-ahụ azụ ya anya.

"Taa bụ ụbọchị kacha arịrị na mba anyị n'ihi na o nwere ụzọ pụrụ iche na ikike ọ na-eji akpa anyị obi aṅụrị. Ya mere anyị jiri hụ ya n'anya. Ya mere anyị ji eru uju Elizabeth dị Ukwu, onye kachasị chịtee aka ma n'ọtụtụ ụzọ pụrụ iche, eze kachasị mma n'akụkọ mba anyị."