Death of Queen Elizabeth II: Nke a bụ mgbe chi ji ehihie jie

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Jonny Dymond
- Ndị mere akụkọ a, Royal correspondent
Ebe a ka chi ji ehihie jie; ọ bụ otu nkeji, ọ bụ otu awa, ọ bụ otu ụbọchị, ọ bụ otu izuụka; n'ebe a ka chi jiri n'etiti ehihie.
Ogologo ndụ ya na ọchịchị ya malitere site n'otu ọgbara banye ọgbara ọzọ, n'ụzọ jupụtara na mma nakwa ihe.
N'oche ọrụ ya, olu ọma ya na-atọ ka mmanụ aṅụ, etu o si akpọpụta okwu ya, nwaanyị anaghị eji ọsịsọ ekwu okwu n'ọha.
Otu ụbọchị dịka anwụ na-amụka, n'agbanyeghị na ndị Britain ka na-achọ inweta onwe ha n'oge oyi dịka a lụchara agha, otu nwata nwaanyị nọ, ntutu isi ya bụ sọ mma, ọla o yi n'olu bụ ọpụrụiche, akpụkpọ ahụ ya na-amụke, nwa agbọghọ bụ sọ mma, mana ndụ ọhụrụ na-amalite n'ihu ya.
Ndụ ọhụrụ ka o ji kwe ndịna-ege ya ntị nkwa. Ọ gwara ha sị: "Agaghị m enwe ike iburu ibu a naanị m." O wee rịọ ha ka ha ghara ịgbakụta ya azụ n'afọ ndị dị n'ihu.

Ebe foto si, Topical Press Agency / Getty Images
Ka ihe karịrị afọ iri asaa gachara, n'emume afọ 75 kamgbe agha ji kwụsị na Europe, nwa agbọghọ ọma nyekwara mgbasaozi ọzọ.
Ọ nọ n'oche, onyonyo nna ya bụ eze nke larala mmụọ dị n'aka nri ya, ntutu isi ya ejupụtala n'ọcha, uwe ya na-acha anụnụ, ọla abụọ dị n'akwa ya, ọla olu atọ dara oke ọnụ ka ọ yi n'olu.
Ogologo afọ ndị a emetụla ya n'ahụ, mana mkpụrụanya ya ka na-egbuke, olu ya ka na-ada ka ogele. O kpu okpu kakị nwere ihe ntunye 'badge' n'ihu ya.
"Aka onye ọbụla dị na ya," ka o kwuru gbasara agha a lụrụ ogologo oge gara aga.
Okpu ahụ o kpu bụ nke ndị otu a kpọrọ 'Second Subaltern Windsor, of the Auxiliary Territorial'. Oge ọ bụ adaeze ka ọ rịọrọ nna ya ka o kwe ya isonyere ndị otu a, iji yiri uwe ma fee ala nna ya, ọbụladị dịka agha na-abịazi na njedebe - agha metụtara ya na obodo ya ọtụtụ afọ.
Ugbua ọ dị afọ 75, okpu a bụ nnukwu ihe o ji eme ọnụ, dịka ọ na-agwa ndị mba ya okwu n'emume a e ji echeta mmeri ha nwetara n'agha ahụ.
Okpu ahụ na-echetara ya ọrụ ọ rụrụ iji nye aka n'oge agha, dịka ndị agha mba ya, nke alaeze ya nakwa nke 'commonwealth' ji ndụ ha chụọ aja iji hụ na nnwereonwe rutere ndị ọzọ aka. Ọrụ enyemaka nke o kwenyere na ọ bụ ya bụ isi okpu eze a nke ndị nna nna ya hafere ya n'aka.
Ka ọtụtụ afọ gachara, n'emume 'Silver Jubilee ya, ọ gwara ndị otu 'Guildhall' sị: "Ọ bụ eziokwu na ihe a bụ mkpebi m nwere mgbe mụ amabeghị ihe ọbụla, mana eji m obi m niile kwudo na ya. M gara mara ọbụla adịghị na ya."
N'ime ọtụtụ afọ ndị a, ọ naghị ekwu oke okwu, ọ naghị ewepụta ihe banyere ya n'ọha.
N'agbanyeghị na a mụrụ ya n'oge mgbasa ozi, ya na ndị ntaakụkọ enweghị mkparịtaụka ọbụla. Oge ụfọdụ, a na-eseta ya n'onyonyo ebe ya na otu enyi ya na-akparịta ụka gbasara ihe ndị ọzọ.
Mana o wepụghịkwa uche ya na tekịnụzụ mgbasaozi. Ọ bụ ya nyere ikike ka a gbasaa emume ichi eze ya na TV, ọ bụ ya nyere ikike ịgbasa ozi ekeresimesi ya na TV, ọ bụ ya ji aka ya kpebie ịgwa ọha obodo okwu na TV n'oge Diana, Adaeze nke Wales nwụchara. "Ndị mmadụ kwesịrị ịhụ m anya tupu ha ekwenye n'okwu m," ka o kwuru.

Ebe foto si, Mirrorpix / Getty Images
Oge niile ka foto ya na-apụta na mgbasa ozi nakwa akwụkwọ akụkọ, foto ebe o yi uwe nwụda bụ sọ ebube. Ihe ndị a bụ njirimara Ezenwaanyị nke bụ ihe o kwerela nkwa ime na ndụ ya. Ịgbasa ozi metụtara ya dịka mmadụ n'ọha esoghi ya.
Akaraka ya na omume ya biri ọma. Ọ bụ akaraka ya ikpuru okpu eze dịka mba ya na-abanye na nnukwu mgbanwe. Mana Ezenwaanyị agbasoghị mgbanwe niile.
Ezenwaanyị ezoghi mmasị o nwere maka omenala, nakwa etu e si emebu ihe n'oge gboo.
Obi ya dị n'ime obodo ya oge niile, n'ebe ahụ ka ya na ịnyịnya ya na nkịta ya, na ndị dịka ya n'ịhụ ụmụ anụmanụ n'anya, ka ọ na-amata n'ezie na mgbanwe ejirila nwayọ nwayọ na-abịa.
"Otu ihe mwute m chọpụtara bụ na ndị mmadụ anaghị anọgide n'otu ọrụ ndụ ha niile, ha na-agbanwe ọrụr dị icheiche ugboro ugboro," ka o kwuru gbasara etu e si ebi ndụ n'oge gboo.
Ezenwaanyị malitere ọchịchị ya n'oge dị oke mkpa na mba Briten. Ha meriri agha ahụ bụ eziokwu, mana ọ gwụrụ ha ike. Mba ahụ abụghịkwa ọkaibe n'akụnụba maọbụ n'ike agha dịka ha bụbu.
Dịka ọchịchị ya na-aga, ọtụtụ ihe gbanwere - ụka, ọchịchị ndị ọgaranya, ihe ndị a kpụrụ afọ n'ala. Ịkpata ego na ịbụ onye a ma ama abụrụla ụzọ e si esonye na ndị ọnụ na-eru n'okwu n'obodo.
Ihe ndị dịka igwe njụ oyi, igwe e ji asa akwa, onyonyo televishọn, igwe e ji azacha ụlọ, abatala gbanwee ndụ ọtụtụ ezinụlọ. Ụmụnwaanyị arụwala ọrụ, otu ndị ọrụ nke mgbe ochie abụrụla ihe gara aga. Ọtụtụ ihe mgbanwe abatala n'obodo, ihe ochie niile.

Ebe foto si, Central Press / Getty Images
Enwekwara ụfọdụ mgbawe n'obi eze ya, ọ kacha oge ọ malitere ọchịchị ọhụrụ. Nke mbụ bụ mgbasaozi ekeresimesiya, nakwa onyonyo 'documentary' nke pụtara na ngwụcha afọ 1960 ga.
Mana mgbanwe a adịghị ọtụtụ. Dịka afọ iri asaa ọ nọrọ n'oche eze na-akpụdebe nso, usoro ọchịchị ya ka yitekwara nke nna ya na nke nna nna ya: Ekeresimesi na afọ ọhụrụ na Sandrigham, emume Easter na Windsor, oge ezumike ya na Balmoral, emume 'Trooping the Colour', emume 'Royal Ascot', emume echichi dị icheiche, mgba ndị nche, emume Sọnde ncheta.
Oge ọchịchọ maka mgbanwe siri ike, Ezenwaanyị ekwenyeghị. Akaraka ya bụ ikpu okpu eze n'oge ikuku mgbanwe na-ebugharị obi eze gburugburu. Akparamagwa ya gosiri na ọ gaghị agbanwe, ọ gaghị eso ihe ọgbara ọhụrụ. Nkwụdosi ike a o nwere n'ebe ọdịnala dị so n'ihe nyeere ya aka n'ọtụtụ nwale nakwa ọdachi nke bịara ya.
Ọnọdụ ya dịka Ezenwaanyị bụ ihe mbụ dị n'obi ya, karịa ezinụlọ ya. Oge ụmụ ya abụọ, Nwaeze Charles na Adaeze Anne, ka bụ ụmụntakịrị, ọ hapụrụ ha n'ụlọ - dịka nne na nna ya si hapụ ya na nwanne ya nwaanyị Margaret n'ụlọ afọ iri abụọ gara aga - oge Ezenwaanyị na Duke nke Edinburgh gara njem nleta ụwa ruo ọnwa isii.
Ọ bụghị na ihe na-eme ụmụ ya anaghị emetụ ya n'obi, kama ọ bụ nne ha ma mgbe ọ nọ nsọ ma mgbe ọ nọ ebe dị anya. Ọ malitere ọrụ ịbụ Ezenwaanyị oge ọ dị naanị afọ 25, o jighikwanụ ya bụ ọrụ egwuri egwu. Ọtụtụ ihe niile gbasara ọdịmma ụmụ ha bụ di Duke n'aka.
Atọ n'ime ụmụ anọ ọ mụrụ gbachara alụkwaghịm n'alụmdinanwunye ha. Dịka onye otu Kraịst, o kwenyere na alụmdinanwunye na-ejikọ ezinụlọ ọnụ. "Alụkwaghịm na nkewa di na nwunye so n'ihe na-akpata oke ọchịchịrị dị n'ụwa taa."
Ọ bụ eziokwu na nkewnye a agbanwetụla n'ime ọtụtụ mmadụ kamgbe ngwụcha 1940 ga, mana onweghị nne maọbụ nna ọ na-amasị ka alụmdinanwunye nwa ya dakpọọ. N'afọ 1992, nke Ezenwaanyị kpọrọ "afọ jọgburu onwe ya", ka Duke na Duchess nke York kewara, Adaeze Anne na Captain Mark Phillips kewara, Nwaeze na Adaeze nke Wales kewakwara.
"Nke a bụ oge nnukwumwute na ndụ ya," otu onye dere akwụkwọ ndụ ya kwuru, ọ bụghị naanị maka na o bupụtara ya n'ọha "kama ọ bụ maka etu ya bụ ihe si mee ka ụfọdụ mmadụ lelịa ogologo afọ iri anọ nke o nyerela iji gbaara mba ya odibọ."
Afọ iri bụ ya n'oche eze jupụtara n'otito ma n'ụlọ ma na mba. Igwe mmadụ na-enupụta ikele ya mgbe ọ bụla o mere njem. N'ụlọ, ọtụtụ kwupụtara n'ọgbara ọhụrụ nke Elizabeth amalitela; Ezenwaanyị n'onwe ya ajụghị nke a.
N'afọ 1960 ga, ihe ji nwayọ nwayọ na-ebelata - Ezenwaanyị etinyewela uchu karịa n'ebe ezinụlọ ya nọ, ụmụaka a mụrụ oge agha kwụsịrị etopụtawala, ihe na-amasị nne na nna ha anaghịkwa amasị ha. Ka afọ 70 na 80 ga, na-erute, ọ ka na-arụsi ọrụ ya ike, mana anya ndị mmadụ, ọ kachasị ndị ntaakụkọ agafeela n'ebe ụmụ ya nọ, alụmdinanwunye ha, nakwa ndị na-alụ ha.

Ebe foto si, PA Media
N'etiti afọ 1990 ga, ọtụtụ ndị mmadụ enwewela obi abụọ gbasara ochịchị eze; ndị ntaakụkọ ụfọdụ amalitela ịkatọ Ezenwaanyị, ụfọdụ na-ajụ ma oche eze a ọ ga-adigide. Ụfọdụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ gụnyere: gịnị bụ ọnọdụ Ezenwaanyị - nakwa nke oche eze ya - n'ụdị ọchịchị ọhụrụ nke Tony Blair ji bata? Olee etu obi eze - nke bụ ebe obibi ọdịnala - ga-ezi dabanye na mgbanwe nke ndị pati Labour ji merie ntuliaka?
Ka ọnwa olemole gachara e nwetachara mmeri ahụ, n'otu abalị n'ọnwa Ọgọst, Diana, Adaeze nke Wales nwụrụ. Okoko flawa n'ihu Obieze Kenisington. Ọkọlọtọ Obieze Buckingham anaghị efe, Ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'iru uju n'ihi ọnwụ adaeze.
"Gosi anyị na o metụrụ gị n'obi," ụlọ ntaakụkọ Daily Express dere. "Ebee ka Ezenwaanyị anyị nọ? Ebee ka ọkọlọtọ ya dị?" ụlọ ntaakụkọ Sun jụrụ. Ruo abalị ise, Ezenwaanyị nọgidere na Balmoral, ọ dịka ọ maghị ihe na-eme n'obodo. Obieze mechara wepụta ozi kwuo na ọ bụ iji chekwaa ma kasie ụmụeze bụ William na Harry obi,
Mana Ezenwaanyị anaghị eji ọdịnala egwu egwu; Balmoral abụghị oge a na-akpatụ aka, onweghị ọkọlọtọ ọbụla na-efe n'Obieze Buckingham ma ọ bụrụ na Ezenwaanyị anọghị ya, Ọkọlọtọ njirimara obi eze anaghị efe n'ọkara.
O mechara laghachi n'Obieze Buckingham. ọ kwụsịtụrụ ka o lee okoko flawa niile dị n'ihu mbara. Otu onye enyemaka ya kwuru na "ụjọ tụrụ anyị ma ndị mmadụ a ga-akpọrị Ezenwaanyị dịka ọ na-arịtu n'ụgbọala ya,"
Na mbụ, o kweghị inye mgbasa ozi. Mana o mechara kweta ịgwa oha obodo okwu. O kwuru okwu tupu akụkọ ụwa nke elekere isii nke BBC. O nweghị ogologo oge iji jikere.
Mana mgbasa ozi ya ụbọchị ahụ enweghị atụ. Okwu ya dị nkenke mana ọ dabara nnọọ nke ọma. O kwuru maka "ihe mmụta dị na ya"; o kwuru okwu "dịka mma nnukwu"; o kwuru maka "mkpebi ya ichekwa" ncheta Diana.
Nke a bụ nnukwu mmeri n'ihe gaara ịbụ nnukwu ọdachi. Ikuku ọjọọ na-ekugharị n'ezinụlọ eze nakwa Obieze jiri nwayọọ fechaa. N'otu oge a n'ọchịchị ya - naanị otu oge a - ọ fọdụrụ ntakịrị ka nnukwu ọdachi dakwasa ya.
Mana njem ofesi Ezenwaanyị na-ewetara ya ọṅụ. N'oge ọnwụ ya, ọ naghị emekarịzi njem, mana n'ọtụtụ afọ ndị gara aga, ọ bụ nnọọ nnukwu mmadụ na mba niile nke ụwa.
Onweghị ihe a ga-eji tụnyere afọ iri mbụ ya n'ọchịchị, oge igwe TV adịbeghị igosi onyonyo ya aghara aghara. Na njem ọ gara na mba Australia n'afọ 1954, ihe karịrị ọkara abụọ n'ime ndị mba ahụ niile pụtara ịhụ ya; na 1961, mmadụ nde abụọ kwụụrụ n'okporo ụzọ ọdọụgbọelu dị na Delhi; na Calcutta, mmadụ nde atọ na ọkara kwụ ọtọ na-achọ ịhụ ada 'Emperor' nke ikpeazụ.
Ọtụtụ ugboro kwa ka Ezenwaanyị nọkwara n'emume iwetu ọkọlọtọ nke alaeze ya. Ugboro ugboro n'afọ 1950 na 1960 ga ka otu n'ime ndị ezinụlọ Obieze gbara akaebe dịka a na-ewetu ọkọlọtọ 'Union Jack' na mpaghara ebe mba Britain jibu ọchịchị, dịka ukwe 'anthem' na-agụ nke ikpeazụ.
N'ihi ntachi obi ya na nkwenye o nwere n'ezinụlọ Obieze nke o si na ya, ọ gbara mbọ ịhụ na mmekọrịta ọhụrụ si na ntụ nke ochie wulite.
Ọtụtụ ụmụnne ya na ikwu ya bi n'obieze nakwa ezinụlọ dị icheiche na mba ya, ebe o nwekwara ọtụtụ ndị hụrụ ya n'anya n'akụkụ ụwa niile, ma ndị ukwu ma ndị nta, ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye.

Ebe foto si, Hulton Archive / Getty images
Njem ofesi ọ na-aga na-abụ n'aha gọọmentị nọ n'ọchịchị; njem ndị a bụ atụmatụ ọchịchị - n'agbanyeghị na anaghị akpọpụta ya otu a, mana e nwere nghọta na mba ọbụla Ezenwaanyị gara njem nleta, mmekọrịta mba ahụ na mba Briten na-akawanye mma.
N'anya ndị mmadụ, njem ndị a na-abụ ihe nlereanya - Ụgbọmmiri eze, ụgbọelu Ezenwaanyị, ọgbakọ oriri na nkwari - maka na tupu njem ụgbọelu abụrụ ihe dị ebe niile, ụdị njem a na-abụ ọgbara ụwa gharịị. Mana nnukwu ọrụ so ya, ogologo ụbọchị na ogologo izuụka, ihe nlere anya, ọgbakọ ndị ọchịchị dị icheiche, ngụpụta ozi ekele. Ndị hụrụla njem ndị a maara ụdị ahụhụ ndị na-ahazi ya na-ata.
Ezenwaanyị anaghị eme njem ezumike na mba ọzọ abụghị UK - njem ofesi ya ọbụla bụ maka ịrụ ọrụ. Ebe ọbụla ọ gara, ọ na-akụnye mkpụrụ ọdịmma n'etiti ha na Briten: Germany oge a lụchara agha na 1965; Mba Chaịna na-emepe emepe na 1986; Russia na 1994, oge a chụpụrụ ndị ọchịchị nke lara ikwunibe ya n'iyi.
Njem ọ gara na mba South Afrịka na 1995 oge e merichara apartheid ka ọ kpọrọ "Otu n'ime ahụmihe kacha pụọ iche na ndụ m". Onyeisiala Nelson Mandela zaghachiri: "Otu n'ime oge agaghị echefu echefu na mba anyị."
Mana onweghị njem nke ka gbaa ọkpụrụkpụ karịa njem ọ gara na Ireland na 2011. N'ime otu narị afọ, o nwebeghị onye eze Britain mere njem gaa mpaghara ndịda. Oge mpa nnukwu ya mere ụdị njem ahụ n'afọ 1911, mpaghara Ireland ka nọ n'ime obodo a kpọrọ 'United Kingdom of Great Britain and Ireland'. Mana ọgbaaghara, nkewa na nnwereonwe abịala.
Ka a lụchara agha mba ụwa nke abụọ, nnukwu ọgbaaghara malitere na mpaghara oke ala, e mechaa ọgụ nnupuisi na iyi ndụ egwu malitere nke nọrọ afọ 30 na mpaghara Northern Ireland na Britain megide ọchịchị ndị Briten, nke a kpatara nnukwu ọchịchị aka ike site n'aka ndị gọọmentị.
Onweghị onye ma mgbe ka mma maka Ezenwaanyị ime njem ahụ n'ihi na onye ọbụla na-atụ ibe ya egwu na mpaghara warawara osimiri nke kewara Briten na Ireland. Mana ka e binyechara aka na nkwekọrịta nke 'Good Friday' ma wepụta atụmatụ iji kewaa ọchịchị, nke a kwụsịrị ọzụzọ Ireland na-azọ mba isii nke mebere Northern Ireland.
Na njem ya ahụ, ihe na-emetụbeghị mbụ mere. N'ogige ncheta, n'etiti Georgian Dublin, ebe e nwere ihe ncheta maka ndị niile lụrụ ọgụ nnwereonwe Ireland iji kwanyere ha ugwu, Ezenwaanyị tinyere okoko flawa iji cheta ha, ma kpọọ isi ala iji kwanyere ndị lusoro ọchịchị Briten ọgụ. Nke a tụrụ onye ọbụla n'anya.
N'emume oriri na-esote ya, ọ malitere okwu ya n'asụsụ Gaelic, nke masịsị ọtụtụ ndị mba Ireland. N'okwu ya ahụ, o ji asụsụ ịrịọ mgbaghara ma kwuo sị; "Anyị leghachi anya azụ, anyị ga-ahụ ihe ndị anyị gaara ime nke ọma karịa etu anyị si mebuo ha, maọbụ ghara ime ha chaachaa."
Tupu njem a ọ gara na mba Ireland, otu onye odeakwụkwọ deburu na "ọ rara ahụ ịrụtụ aka n'ọkpụrụkpụ ihe ọbụla" ọchịchị ya mepụtara. Mana nke a abụghịzi eziokwu. Njem abalị anọ ahụ, nke jupụtara n'okwu nakwa omume dabara adaba zachapụrụ iwe n'ọnụma nọrọla ọtụtụ afọ. Ikekwe, onweghị ọkpụrụkpụ ihe Ezenwaanyị meere oche eze ya nakwa mba ya karịa nke a.
Ireland bụ nnukwu ọgbatuhie nyere ọtụtụ ndị rụrụla ọrụ dịka Praịm Mịnịsta. Malite na Winston Churchill, onye kwuru na "ọdachi Fermanagh na Tyrone" na-awalite dịka agha mba ụwa nke mbụ kwụsịrịla, inye ọchịchị Briten nsogbu. Nsogbu ikpeazụ ya bụ Boris Johnson, onye nwere nnukwu nhịahụ gbasara okwu okeala n'ime mba ahụ, nakwa ihe gbasara ọpụpụ mba UK pụrụ n'otu 'European Union'.
O gere ndị Praịm Mịnịsta niile ndị a ntị. Kwa izuụka ya na Praịm Mịnịsta na-enwe ọgbakọ, ọ bụghị iji rịọ ha ihe ọbụla maọbụ iji tụgharịa atụmatụ ọchịchị ha, kama ọ bụ iji dụọ ha ọdụ, jalite mmụọ ha maọbụ dọọ ha aka na ntị.
Ọ nọ ya oge niile ige ha ntị. Ndị Praịm Mịnịsta niile a tụkwasara ya obi na onweghị ihe ha gwara ya ntị ọzọ ga-anụ. Ọ bụ otu onye ha niile nwereike ịgakwuru kọsara ya obi ha, onye ghọtara usoro ọchịchị nke ọma. Nke a bụ nnukwu ihe ikute ume ndụ nye ndị Praịm Mịnịsta ndị, ọtụtụ n'ime ha bụ ndị nwere ọdachị dị icheiche chere ha n'ihu, ndị na-achọ onye ha ga-akọsara.
"Ha na-ahapụ onwe ha aka ma kọọrọ ihe ọbụla na--aga na ndụ ha," Ezenwaanyị kwuru n'etiti ọchịchị ya. "Ọ bụrụ na ha nwere nsogbu, oge ụfọdụ, ana m enyere ha aka n'ụzọ dị otu ahụ."
Onweghị ihe ga-eme ka o kwupụta ihe kpara n'ọgbakọ ndị ahụ, na-abụghị naanị okwu otito maka uchu Ezenwaanyị na-etinye n'ọrụ ya. Akpati mmee ebe a na-etinye akwụkwọ gọọmentị nke ọ na-agụ, na-eso ya aga ebe ọbụla ọ na-aga, Balmoral, njem, n'ụgbọ oloko eze, maọbụ n'ụgbọmmiri eze.
Ode akwụkwọ ya n'afọ 1970 ga kwuru na Ezenwaanyị na-ewepụta awa atọ kwa ụbọchị iji gụọ akwụkwọ dị icheiche si n'isi ụlọọrụ ọchịchị.
Ọ naghịkwa echefu ihe ọ gụrụ, oge ụfọdụ nke a na-atụ ndị Praịm Mịnịsta ya n'anya. "Ọ tụrụ m n'anya nke ukwuu," Harold Macmillan dere, "etu Ezenwaanyị simarachaa kpọmkwem ozi niile si n'ọba ozi gọọmentị."

Ebe foto si, Getty Images
Ọrụ eze na-arụ n'ọchịchị agbatuola nke ukwuu oge Ezenwaanyị rigoro n'oche eze. Mana e nwere ngalaba abụọ ebe ọ ka nwere ọrụ dịka eze: ịhọpụta onye ga-abụ Praịm Mịnịsta iji hazie gọọmentị, nakwa mgbe e nwere ike ikposa gọọmentị.
Na mmalite ọchịchị ya, tupu ndị 'Conservatives' amalite ịhọpụta ndị ọchịchị ha, ọ bụrụ na Praịm Mịnịsta otu 'Conservative' gbaa arụkwaghịm, ọ na-eji echiche nke ya họpụta onye ga-ahazi gọọmentị ọhụrụ.
Mana oge ndị 'Conservatives' malitere ime ntuliaka iji họpụta ndị isi ha, ọrụ ahụ pụrụ n'aka ya. Ka ọtụtụ afọ na-aga, Ezenwaanyị ịhọpụta onye ga-abụ Praịm Mịnịsta pụrụ kpamkpam n'usoro ọchịchị mba Briten. Ọ bụrụ na ntuliaka bụrụ nhatanha nke na onweghị onye doro anya meriri ntuliaka ahụ, ihe a na-ekwu bụ etu a ga-esi "chekwaa" obi eze ka ọ ghara itinye ọnụ n'okwu ọchịchị.
Onweghị mgbe Ezenwaanyị jụrụ ikposa ụlọ omeiwu, nke a gaara abụ nnukwu ihe ịtụnanya ma o mee ya. Ọ ghọtara nke ọma ihe ọrụ ya bụ.
Obieze anaghị etinye ọnụ chaa n'okw ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ gbara ọtụtụ gharịị mgbe otu onye odee kwuru na Ezenwaanyị na-akpazo ndị ndu 'Labour' agwa ọma karịa ndị 'Conservative'. N'agbanyeghị nhịahụ dị n'etiti ya na Margaret Thatcher, Ezenwaanyị gara emume akwamozu ya, naanị Winston Churchill ka ọ kwanyerela ugwu dị otu a mbụ.
Mana a ga-asị na ọ kwụ n'etiti na nkwenye ndọrọndọrọ ọchịchị; o topụtara mmadụ n'oge udo, oge e hibere ngalaba 'National Health Service', oge ọchịchị obodo na-agbatị enyemaka ọdịmma na agụmakwụkwọ maka ndị mmadụ. Nsogbu nke so mmalite afọ 1980 ga - enweghị ọrụ, ngagharịiwe na mba ndị mepere emepe, oge mgbatu akụnụba na abụbụ ọrụ ndị ọrụ na-egwupụta ihe n'ala na-ebute nsogbu n'etiti obodo na obodo - wetara atụmatụ ịdịnotu Briten n'isi njedebe.
Okwu otu onye ọrụ mgbasaozi n'obi eze gwara ndị ntaakụkọ Sunday Times n'afọ 1986 gosiri na obi adịghị obi eze mma maka atụmatụ gọọmentị. Nke a bụ iji tụpenye azụ n'echiche onye eze kwenyere na ọrụ dị mkpa o nwere bụ ijikọ obodo na-ekewa ekewa.
Ugboro abụọ ka o tinyere ọnụ n'ụzọ pụrụ iche n'okwu gbasara nnwereonwe mba Scotland, nke mbụ bụ na mgbasaozi o mere n'ebe afọ 1970 ga, nke abụọ bụ tupu e mee ntuliaka 'referendum' nke afọ 2014. Ụfọdụ na-ekwu na nke a bụkwa itinye ọnụ n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, mana ọ gbaghị gharịị na Ezenwaanyị ga-adọ aka na ntị megide ndị chọrọ ikewa alaeze ya.
Ụfọdụ na-ekwukwa na o mere nke a n'ihi na ọ bụghị na-anabata mgbanwe. Nke a nwere ike ịbụ eziokwu. Mana eze ikpeazụ tinyere aka na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ papa nnukwu ya George nke ise. Oge Ezenwaanyị na-ewere ọchịchị, ọrụ ndọrondọrọ ọchịchị apụọla ha n'aka. Ọrụ ocheeze a wetaara ya bụ inwe akọ n'ụche, ige ndị ọzọ ntị. Ọ ghọtara nke a site na mbido. Ebe a ka omume ya na akaraka ya jikọrọ nnọọ aka.
Ọ bụ site n'iwepu onwe ya n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị dịka onyeisiala, nakwa ekweghị ka ikuku mgbanwe bugharịa oche eze ya, ka o ji nwee ike inweta mmeri n'ọrụ ya, nke mekwara ka ọtụtụ mmadụ hụ ya n'anya ma na-akwanyere ya ugwu, dịka onye isi obodo.
Nke a bụ iwu nke edepụtaghị edepụta maka alaeze ọgbaraọhụrụ. Ọ bụ ebe a ka akparamagwa ya duru ya n'ọchịchị ya.

Ebe foto si, Getty Images
Papa nnukwu ya bụ onye hibere ntọala maka alaeze nke gbaara mba ya odibo, ọbụghị ịchị ha achị, mana o tinyere ọtụtụ oge ya n'ịgba nnụnnụ. Ọchịchị nke nna ya bịara bụ nke si na chi ya; e tinyere ya n'ọkwa ọ na-atụghị anya ya, uwe ndị agha ka o yiri chịa ọtụtụ afọ dịka eze.
Mana ka ọdachi na nkọcha bịachara n'oge 1990 ga, Alaeze ahụ wulitekwara ọzọ. Mana dịka ọtụtụ na-atụ anya mgbanwe na ndọrọndọrọ ọchịchị, dịka ndị ọchịchị mere onwe ha ihe ịkpa ọchị, Ezenwaanyị na-anaghị achọ nsogbu pulitere bụrụ akara ịkwụba aka ọtọ n'etiti mba nke ikuku mgbanwe, obi ịda mba na nkewa na-ebugharị.
Nke a bụ ụzọ mba ya ji kwụọ ya ụgwọ maka ndidi ya, maka ịkwudosi ike, ịjụ isoneyere ndị aka nri maọbụ ndị aka ekpe, ịjụ ka ikuku mgbanwe bugharịa ya, maọbụ ịsa ndị na-akatọ ya na ezinụlọ ya okwu ogologo afọ ndị a.
O wepụrụ onwe ya n'ihe ndị a, ọ bụghị maka ọkwa dị elu o ji, kama ọ bụ maka na ọ na-akwanyere onwe ya ugwu pụrụ iche, ọ naghị etinye aka na ndụ tụmsara nke e ji mara ndị ọgbara ọhụrụ a.
Ọ ghọtara nke ọma na ọrụ ya dịka onye eze - emume ọdịnala, ọmụmụ nwa na agbamakwụkwọ na ọnwụ - bụ ihe nkasị obi maka ndị mgbanwe omenala ndị gboo na-ewute, bịakwa bụrụ ihe ncheta na ndụ ụwa metụtara ụdị ndị mmadụ dị icheiche n'agbanyeghi ogogo, afọ maọbụ ọnụ mmadụ nọ.
Ọ ghọtakwara na ọ bụghị ihe niile gbasara mba ya kwesịrị ịkọwaru n'isi, na maka mba nke ikuku mgbanwe na-ebugharịrị oge niile, ọganihu nke ọkwa ya na-egosipụta bara nnukwu uru karịa ihe ọbụla.
Nwa ada a ji amamihe nke karịrị afọ ya, kwe nkwa ịgba odibọ ọtụtụ afọ gara, ewetela nnukwu nkwanye ugwu na ịhụnanya nye oche eze ya.
O nwereike ime nke a n'ihi na akparamagwa ya gosipụtara ihe ọ ga-amasị ụmụafọ Briten ịhụta dịka omume ha kacha mma: umeala, anaghị eme oke mkpesa, inwe ọgụgụ isi, inwe akọnuche, ịghọta onwe, ịdị uchu, itinyere ụwa obi oma, anaghị ewe iwe ngwangwa, na ịkpa ezi agwa.
"Mụ bụ ebe nchedo ikpeazu maka akara ọma ndị a," ka o kwuru n'otu oge. Ọ naghị eme mpako na ọ na-akpa agwa ọma karịa ndị ọzọ, kama ọ na-akọwa ọrụ ya nakwa ndụ ya. Ọ bụ ndụ ya bụrụkwa ọrụ ya igosipụta ihe niile kacha mma maka mba Briten.
Nke a bụ ọrụ ọ rụkwaranụ.










