You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kano Blast: "Anyị nwụchiri otu onye na-ere ngwa e ji eme ogbunigwe" - Ndị uweojii
Ndị uweojii na Kano ekwuola na ha nwuchiri otu nwoke maka ịre kemikal e ji eme ogbunigwe na nzuzo n'akụkụ ebe ihe gbara na Sabon-Gari dị na steeti ahụ.
Ha kwuru nke a n'ozi ha weputara gbasara ihe mere na steeti ahụ dịka nnyocha na-aha n'ihu gbgasara ya.
Ha bụ ndị uweojii kwuru na ọ bụ gaasị gbara n'ebe ahụ ebe ndị ọzọ kwuru na ọ bụ ogbunigwe gbara.
Cheta na mmadụ itoolu nwuru ebe mmadụ asatọ ọzọ gụnyere ụmụaka nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ maka ihe mere.
Ndị uweojii akpọpụtala aha ndị nwụrụ n'ọdachi ahụ
N'otu ozi ahụ ndị uweojii gbasara ha kpọpụtara aha mmadụ itoolu nwụrụ na ya bụ ọdachi.
i. Ejike Vincent
ii. Michael Adejo
iii. Musa Kalla
iv. Christiana Abosade
v. Mary
vi. Austine Dada
vii. Madam Owoleke
viii. Omo Ben
ix. Bose Oladapo
"E cheghị m na ụda ahụ anyị nụrụ ebe ahụ bụ ụda gaasị" - Onye ahịa n'Aba Road, Kano
Ndị nọ an-ebe ya bụ oke ụda gburu mmadụ Itoolu n'Aba Road dị na Sabon Gari Kano ekwuola ihe ha hụrụ ebe ahụ.
Onye nọ ebe ahụ achọghị ka a kpọọ aha ya sị na "a nọ n'ụlọahịa m dị nso ebe ahụ ya bụ ihe mere nụ mgbe ya bụ oke ụda dara. Anyị gbapụtara gawa ebe ahụ were hụ ebe ụlọ dagidere ụm̀ụaka abụọ bụ ndị anyị zọpụtara".
O kwuru na o ruchara otu awa tupu ndị ọrụ nchekwa abịa ebe ahụ bịa nyewe aka.
Ọ kwukwara na ya echeghị na ọ bụ ụda gaasị bụ ihe ahụ.
Ọ sị na "Oke ụda dị otu ahụ kwayara ụlọahịa anyị abụghị ụda gaasị".
O kwukwara na ha hụru ihe ruru mmadụ ise nwụrụ anwụ ebuputere ebe ahụ.
"O nweghị onye na-ere gassị n'ihu ebe ahụ, mana e nwere onye ọkpụ ụzụ na ndị na-ere ihe ọzọ n'akụkụ ebe ahụ".
"Ndị nwụrụla na gaasị ahụ gbawara n'Aba Road dị na Sabon Gari Kano eruola itoolu"
Ngalaba a kpọrọ Federal Ministry of Humanitarian Affairs ekwuola na agụpụtala ozu mmadụ itoolu n'ụlọ ahụ dara mgbe gaasị gbawara n'ụlọ dị n'akụkụ ụlọakwụkwọ n'Aba Road Sabon Gari, Kamo n'ụbọchị Tuzde.
Ụlọọrụ a sị na onyeisi ha bụ Mustapha Habib Ahmed mere njem n'ebe ahụ dịka ha na-agba mbọ ịzọpụta ndị mmadụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ha ndị ọrụ gbata gbata ndị ọzọ na-ejikọ aka ọnụ ịhụ na a gbapụtara ndị a.
Cheta na ndị uweojii Kano steeti kwuru na ihe a na-eche bụ ogbunigwe gbara na mpaghara Sabongari nke Kano Steeti bụ karama ikuku gasị bụ ihe gbara ọkụ ma gbuo ndị mmadụ.
Ọ bụ Kọmịshịna ndị uweojii steeti ahụ bụ Sam'ila Dikko kwuru nke a ma kwuo kwa na ọ bụ mmadụ anọ nwụrụla na ya nke bụ ụmụ nwoke atọ na otu nwaanyị.
O kwuru sị," Ọ bụghị ogbunigwe gbara, ọ bụ gaasị gbara ọkụ n'ihi na e nwere onye na-agba igwe ọkụ nọ ebe ahụ. Ọ bụ kwa onye a nwe ebe a na-agba igwe okụ bụ onye mbụ nwụrụ nụ".
Dikko gara n'ihu kwuo, " Ọ bụ naanị mmadụ anọ nwụrụla, enweghị ndị merụrụ ahụ, anyị ebidola iji ụgbọala 'Bulldozer' ikpocha[pụ ma chọpụta ihe ọzọ ọ metụtara".
Dịka ọ dị ugbua, ndị ọrụ gbata gbata nke Red Cross awuchiela ebe ahụ ugbua.
Ndị ọrụ nchekwa ọzọ na ndị isi ha nke gụnyere ndị NSCDC na ndị agha na ndị nchekwa ọzọ juputara ebe ahụ ugbua.
Kọmịshọna mgbasa ozi Kano Steeti bụ Muhammad Garba kwuru na ọ bụghị n'ụlọ akwụkwo ka ya bụ ihe mere.
Ọ kọwara na ọ bụ n'ebe a na-ere nrị ụmu anụmaụ nke dị na mpaghara 'Aba Road' Sabon Gari dị na Steeti ahụ.
O kwuru sị, "Amatabeghị ihe kpatara ya maọbụ ihe o mebiri n'uju ya, kama ebidola nyocha ịmata ihe ndị a".
Ihe onyonyo na-efegharị na Soshal Midịa na-egosi ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ndị ntakịrị merụrụ ahụ.
Ebe ụfọdụ ihe onyonyo a na-egosi ka ndị mmadụ na-achọ ịkpọpụta ndị ụlọ dakwasịrị.
Akụkọ ka na-abịa