Igbo Language: Ashawo, Iyori. Osikapa na okwu ndị ọzọ dị n'asụsụ Igbo e bitere n'asụsụ ndị ọzọ

Ndị akwụna nọ na Benin

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, "Ọ bụ maka na ha na-akwụ n'ụzọ ka igbo siri tụgharịa nke ha" - Nnabuihe
    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service

Asụsụ Igbo bụ asụsụ bụ otu n'ime ihe e jiri mara ndị Igbo.

Ya bụ asụsụ bụ asụsụ ị ga-anụta n'ụfọdụ asụsụ maọbụ okwu ndị mpaghara ọzọ na-abụghị ndị Igbo na-asụ.

Ị ga-enweta ya etua ọ kachasị na mba Jamaica.

Dịka ndị Igbo na-eti aka n'obi jiri asụsụ ha eme ọnụ, ị mara na-enwere ụfọdụ okwu dị n'asụsụ Igbo ndị Igbo na-asụ bụ nke ha bitere ndị mba ọzọ.

Ọkammụta n'ihe gbasara asụsụ Igbo na mahadum 'Univertsity of Lagos' bụ Chigozie Nnabuihe gbara ama n'ezie na e nwere ụfọdụ mkpụrụokwu a na-ewe dịka asụsụ Igbo mana ha bụ mkpụrụokwu e bitere ndị mba ọzọ.

Lee ụfọdụ mkpụrụ okwu ndị ikpo ji ekwu okwu ha bitere ndị mba ọzọ.

1) Agboro dịka ndị Igbo sị akpọ ya bụ okwu ha bitere n'aka ndị Yoruba.

Agboro bụ okwu Yoroba a na akpọ Agbero

Ndị Yoroba na-akpọ 'agbero' nke pụtara onye na-achọta ndị njem.

line

2) Ashawo bụ mkpụrụokwu ọzọ e bitere ebite.

Okwu ahụ nke e bitere n'aka ndị Yoroba bụ 'ashewo' n'asụsụ ha.

Ndị akwụna nọ na Benin

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, "Ọ bụ maka na ha na-akwụ n'ụzọ ka igbo siri tụgharịa nke ha" - Nnabuihe

Nnabuihe kwuru sị, " N'asụsụ Yoroba, 'ashewo pụtara onye na-eji ahụ ya ahụ ọrụ arụta ego".

O kwuru sị, " Ndị Igbo chọrọ ịnweta nke ha were kpọọ ya 'Akwụna Akwụna' n'ihi na ha na-akwụ n'ụzọ.

line

3) Osikapa bụ okwu e bitere n'aka ndị Awụsa nke bụ 'shinkafa'

Osikapa

Nnabuihe Kwuru na osikapa bụ okwu ndị Igbo bitere n'aka ndị Awụsa.

Ọ kọwara na ọ bụ ndị Igbo nọ n'Ebonyi Steeti dịka ndị Abakaliki ndị ala ha nwereike ịkọpụta osikapa dịka ala ndị Awụsa sị akọpụta.

O kwuru na ndị Abakaliki bụ ndị na-akọ osikapa ma kọwaa na ndị Igbo enweghị osikapa na ndụ ọdịnala ha.

O kwuru sị, " Ọ bụ ndị Ebonyi tinyere ya 'O' na ebe enwere 'F' ha akpọọ ya P, nke pụtara 'oshikapa'.

Kama ọ kọwara na ndị Igbo ndị nọ n'elu ala kpọrọ ya Osikapa.

line

4) Ịchafụ bụ mkpụrụokwu ndị Igbo bitere n'aka ndị Frenchi dịka nnabuihe siri kọwaa.

Ịchafụ bụ mkpụrụokwu ndị Frenchị nke bụ Chiffon.

Sari fabric on table
Nkọwa foto, Akwa Chiffon
line

5) Iyori nti bụ okwu e bitere n'aka ndị Inglishi bụ 'Earring'.

Nnabuihe kwuru sị, " Ndị Bekee na-akpọ ya ;eatring' ,ebe ndị igbo na-akpọ ya 'Iyori ntị".

line

6) Nkọm (Ngaji) bụ okwu ndị Ohafia bitere n'aka ndị Kalaba

Ngaji
Nkọwa foto, Ndị Ohafia bitere aha ya n'olu ndị Kalaba

Nnabuihe kwuru na ndị Ohafia na ndị Kalaba na-eke otu oke ala.

O kwuru sị, " Ndị Ohafia na-akpọ ngaji Nkọm nke bụ okwu ha bitere n'aka ndị Ohafia.

line

7) Ekpe na Ekpo bụ okwu Ohafia, Abiriba,Ibeku na ebe ndị ọzọ bitere n'aka ndị Kalaba

Nnabuihe kọwara na aha ndịa nke bụ otu na mmanwụ bụ aha ndị Igbo nwere ihe ndịa bitere n'okwu ndị Kalaba.

Ekpe Cult: Otu naaní úmú nwoke
Nkọwa foto, Ndị otu Ekpe
line

8) Ọkọn bụ ihe ọzọ ndị Ohafia na Abiriba bitere n'okwu ndị Kalaba

Nnabuihe kọwara na ọ bụ emume ndị mmadụ ji eme awansị.

O kwuru na ọ bụ egwu ọdịnala, ma kọwaa na ọkọn bụ okwu e bitere ndị Kalaba.

Aha onyonyo, Aha Ịhụnanya dị icheiche n'asụsụ Igbo
line

E nwere mkpụrụokwu ndị ọzọ ndị Igbo na ndị mba ọzọ na-akpọkọta ọnụ

Nnabuihe gara n'ihu kwuo na enwere ụfọdụ okwu ndị Igbo na ndị mba ọzọ na-akpọkọrịta kama na ọ maghị ndị bitere n'aka ibe ya.

A) Ogede - Nnabuihe kwuru na dịka ụfọdụ ebe na Anambra na-akpọ Abịrịka Ogede, ma kama ndị Yoruba na-akpọ nke ha Ogede.

B) Ori- Ọ kwukwara sị, "Dịka ụfọdụ mpaghara Igbo na-akpọ Okwọma Ori, ndị Yoruba na-akpọ kwa ya Ori".

Mana Nnabuihe kọwara ọ maghị ndị bitere okwu ndịa n'aka ibe ya.