Epilepsy Meaning: Etu ị ga-esi nyere onye nwere akwụkwụ aka

Etu e si enyere onye na-ada ada aka

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Akwụkwụ, nke bekee kpọrọ 'epilepsy', bụ otu ọnọdụ ahụike a na-ahụta ka ihe arụ n'omenala Igbo.

Etu ya bụ ihe si egosipụta onwe ya n'ahụ mmadụ bụ site n'ihe ọdịdọ nke bekee kpọrọ 'seizures'.

Ihe ọdịdọ bụ mgbe ahụ mmadụ malitere ịma jijiji n'otu ntabi anya, onye ahụ agaghị enwetakwa onwe ya, o nwere ike daa n'ala, o nwekwara ike ọfụfụ esi ya n'ọnụ na-apụta.

Ọtụtụ oge, ndị mmadụ na-agbara onye nwere ụdị ọnọdụ a ọsọ ma na-asọkwa ya asọ.

Nke a jọgburu onwe ya. Ọzọkwa bụ na enwere ihe ndị ọzọ nwere ike ịkpatara mmadụ ihe ọdịdọ.

Ihe ndị ọzọ nwere ike ịkpatara mmadụ ihe ọdịdọ:

Akwụkwụ, nke bekee kpọrọ ‘epilepsy’, bụ otu ọnọdụ ahụike a na-ahụta ka ihe arụ n’omenala Igbo.

Ebe foto si, Getty Images

  • Mmadụ icheta ihe yiri ya egwu n'oge gara aga (ihe mberede okporo ụzọ, mwakpo nwaanyị maọbụ ntọrọ mmadụ.) Bekee na-akpọ ya 'Post Traumatic Stress Disorder'.
  • Oke ụjọ ijide mmadụ n'ihi ihe ọjọọ onye ahụ na-atụ egwu na o nwere ike ime (panic attack maọbụ anxiety attack).
  • Oke nchekasị ụbụrụ (Mental stress)
  • Ọrịa obi nakwa ọrịa mkpọnwụ ahụ (Heart Disease and Stroke)
  • Oke ahụ ọkụ, ọ kachasị n'ụmụaka (Febrile Seizures)

Adịmiche n'etiti ọrịa akwụkwụ na ihe ọdịdọ ndị ọzọ

Adedoyinsola Oseni, onyeisi otu 'Mary Special Needs Foundation', kwuru na onweghị nnukwu ndịiche n'etiti ihe ọdịdọ nke ọrịa akwụkwụ kpatara na ihe ọdịdọ ndị ọzọ.

"Ma ndị dọkịta bụ ọkachamara, ọ gaghị adịchara ha mfe ikwu ihe di iche ma ọ bụrụ na ha ebughị ụzọ mee nnyocha miri emi," Oriaku Oseni dere n'akwụkwọ ya.

Na webụsaịtị nke ụlọọgwụ 'Cleveland Clinic' na mba Amerịka, ha kọwara na ihe ọdịdọ nkịtị a kpọrọ 'Non-Epileptic Seizures' na-eyite ihe ọdịdọ nke akwụkwụ na-akpata.

"Naanị ndịịche dị na ha bụ ihe na-akpata ha. Ihe ọdịdọ akwụkwụ bụ n'ụbụrụ mmadụ ka ọ na-ebido, mana ihe ọdịdọ ndị ọzọ abụghị n'ụbụrụ ka ha na-ebido."

Ihe kacha mkpa

Ọ bụghị ajọ mmụọ maọbụ ọgwụ agwọrọ agwọ na-akpata

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ bụghị ajọ mmụọ maọbụ ọgwụ agwọrọ agwọ na-akpata

Ọtụtụ ndị ọkachamara ahụike ekwuola na akwụkwụ abụghị ọrịa n'onwe ya.

N'akwụkwọ 'Epilepsy Handbook' nke ụlọọrụ Mary Special Needs Foundation bipụtara, dọkịta Seyi Roberts dere sị:

"Akwụkwụ dị nnọọ ka ọnọdụ ahụike ndị ọzọ siri ike dịka ọbara mgbalielu (Hypertension), ọrịa shuga (Diabetes) maọbụ asthma."

N'ihi nke a, ọ dị mkpa ka ị mata na:

  • Akwụkwụ anaghị efe efe
  • Asu mmiri onye akwụkwụ agaghị ebufe onye ọzọ ya bụ ọrịa
  • Ọ bụghị ajọ mmụọ na-akpata akwụkwụ
  • Ọ bụghị arụ mmadụ mere, maọbụ ịbụ ọnụ na-ebutere mmadụ akwụkwụ
  • Inyere onye nwere ihe ọdịdọ akwụkwụ aka, agaghị eme ka i bute akwụkwụ
  • Ọ bụ eziokwu na enwebeghị ọgwụ na-agwọ akwụkwụ ka ọ laa kpamkpam, mana e nwere ọgwụ ndị ga-enyere onye ahụ aka ka o bie ndụ ya nke ọma

Etu ị ga-esi nyere onye na-enwere ọdịdọ aka

Mee ka onye ahụ dinara ala n'akụkụ ya ka o nwee ike ị na-ekute ume

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mee ka onye ahụ dinara ala n'akụkụ ya ka o nwee ike ị na-ekute ume
  • Ekwela ka ndị mmadụ gbaa ya okirikiri, nye efe ka ọ na-anata ikuku ndụ
  • Wepu ihe ọbụla nwere ike imerụ mmadụ ahụ n'okirikiri ahụ
  • Biko etinyekwala onye ahụ ihe ọbụla n'ọnụ, dịka ngajị maọbụ osisi
  • Ejichikwala onye ahụ, hapụ ya ka ihe ọdịdọ ahụ were aka ya kwụsị
  • Mee ka onye ahụ dinara ala n'akụkụ ya ka o nwee ike ị na-ekute ume
  • Gbalịa mata oge ihe ọdịdọ ahụ malitere, matakwa mgbe ọ kwụsịrị