Australia ga-agbape mba ha ha gbachiri kamgbe afọ abụọ gara aga

Kamgbe afọ abụọ gara aga, Austarlia hibere usoro nchekwa tara akpụ nye ndị njem maka ha achọghị ka ọrịa Covid-19 febata mba ha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kamgbe afọ abụọ gara aga, Austarlia hibere usoro nchekwa tara akpụ nye ndị njem maka ha achọghị ka ọrịa Covid-19 febata mba ha

Mba Australia ekwupụtala atụmatụ nkagbu mmachi amachiri ndị mmadụ ibata mba ha ọkachasi ndị njem nlegharị anya kamgbe afọ abụọ gara aga.

Ugbua ha ekwuola ha ga-ekwe ndị njem nlereanya gbarala ọgwụ mgbochi ọrịa covid-19 nakwa ndị ọzọ nwere akwụkwọ njem gbarala ọgwụ a ibeta mba ha.

Prime Minista mba a bụ Scott Morrison kwuru, "Ọ bụrụ na igbazuola ọgwụ mgbochi a nke ugboro abụọ ya, anyị na-atụ anya ịnabata gị."

Nnabata ndị njem na mba ahụ a sị ga-amalite n'ụbọchị 21 nke ọnwa Febụwarị ga-abụ ihe ọṅụ nye ọtụtụ ndị mmadụ, ndị ụlọọrụ si esi abata, ụmụakwụkwọ si mba ndị ọzọ abịa nakwa ndị ọzọ.

Mba Australia so na mba kacha hibe usoro nchekwa tara akpụ maka ọrịa Covid-19 na mba ụwa nke mmachiri ndị mmadụ ibata mba ha.

Cheta na n'ọnwa Maachị nke afọ 2020, gọọmentị mba a gbachiri okeala mba ha nke gbochiri ọtụtụ ndị mba ọzọ ịbate na mba ahụ

Ha gara n'ihu wee tinye ọkpụ ngụkọta mmadụ ole ndị na-abịa maka njem dị mkpa ga-enwe ike ibata.

Ndị e kwere bata n'oge ahụ bụ ụfọdụ ụmụakwụkwọ sị mba ndị ọzọ na ndị mbịarambịa nwere ihe dị ezigbo mkpa enyere ikike ibata n'ebe ọnwa Disemba 2021.

N'ụbọchị Mọnde, Morrison kwuru na ndị aga-ekwe abanye mba Australia ma emepee ókèala ha ga-egosiriri akwụkwọ ahụike nke ga-agba akaebe na ha agbaala ọgwụ mgbochi ọrịa a.

N'okwu ya ọ sị: "Nke ahụ bụ iwu. A na-atụ anya onye ọ bụla irube isi na ya"

Ndị njem ọbụla ndị ọrụ ahụike gụpụrụ n'ịgba ya bụ ọgwụ mgbochi maka ahụike ha ga etinye akwụkwọ arịorịọ ka anabata ha.

Ọ bụrụ na abata ya bụ akwụkwọ, ndị ahụ ga-edopụ onwe ha iche n'ụlọ ezumike ruo abalị ole m ole.