'Biafra na-enye anyị ohere ihe anyị nwereike ịbụ' - Ọkaikpe Nkemdilim Izuako

Aha onyonyo, Ọkaikpe Nkemdilim Izuako

Okwu inweta Biafra bụ nke na-ewu ewu kamgbe ebe ọtụtụ ndị Igbo ọkachasị ndị ntoroọbịa na-ekwu ka e mee refarandum.

Okwu a bụ nke na-ebiri ọkụ kamgbe nke mere na ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa etinyela ya ọnụ.

BBC Igbo zutere otu onye ọkaikpe na-arụ n'otu mbaụwa United Nations aha ya bụ Ọkaikpe Nkemdilim Izuako bụ onye tinyere ọnụ n'okwu gbasara Biafra.

O kwuru na ya na-echeta agha Biafra, na ya na-eji obi aṅụrị echeta ya maka na agha ahụ gosiri ụmụIgbo ihe ha nwereike imepụa n'onwe ha mana o bere arịrị na agha bere, ụmụIgbo etufuo ihe niile ha mepụtara oge agha.

O kwuru na ugbua, okwu Biafra ekwesighi ịbụ ịzọ oke ala kama ndị ọnụ na-eru n'okwu kwesiri ịkpa nkata ime ụlọ gbasara ya.

Gịnị ka ha ga-akpa n'ime ụlọ, kirie onyonyo a ka ị chọpụta ihe ọ gwara BBC Igbo.

Akụkọ ga-amasị gị: