School fees: Obodo eji ọkụkọ, ewu na atụrụ akwụ ụgwọ ụlọakwụkwọ

Minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'obodo Zimbabwe bụ Lazarus Dokora bụ onye mere ka maata nke a.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ Sunday Mail Newspaper na ụlọakwụkwọ ga-anabata ndị na-enweghi ego ịkwụ ụgwọ ụlọakwụkwọ ha n'oge.

Ọ kwukwara na ọ bụghị naanị anụmanụ dị ndụ ka ha na-ana, mana ha na-anabata ndị nwere aka ọrụ.

"Ọ bụrụ na ha nwere ndị na-enye aka ịrụ ụlọ n'obodo, ha ga-enyere ha ohere i ji aka ọrụ ahụ wee rụpụta ụgwọ ụlọakwụkwọ ha," dịka ndị ntaakụkọ jiri kọwa.

Ụfọdụ n'ime ụlọakwụkwọ ebidola ịnabata anụmanụ ndụ dịka ụgwọ ụlọakwụkwọ dịka Sunday Mail kwuru.

Onye na-arụ na ministri kọwatụrụ na okwu Dọkịta Dokora na "Ndị nne na nna ya bụ ụmụ ụlọakwụkwọ nwereike ịkwụ ụgwọ site n'iji anụmanụ ndụ-

Ya bụ maka ndị bi n'ime obodo, mana ndị nne na nna ndị ụmụakwụkwọ bị na mba nwereike iji aka ọrụ wee kwụọ ụgwọ ụlọakwụkwọ."

Iwu a sonyere aka ndị Zimbabwe kwere ka ndị mmadụ na-eji anụmanụ ndụ, dịka ewu, ehi, na atụrụ, ji wee kwụọ ụgwọ na mbite.

N'ime iwu ndị ụlọ omeiwu ha wulitere n'izu a, a nabatara ka ndị mbite tinye aka n'ime akụnaụba ha nwere dị mfe gụnyere ụgbọala, igwe, dgz ji manye maka mbite dịka mpaghara ndị ntaakụkọ BBC World na-eleba anya na azụmaahịa kwuru.

Dịka ụlọ ntaakụkọ Bulawayo24 siri kwuo, ego na-adịghị na mba Zimbabawe na-eme ka ndị mmadụ mefuo oge n'ụlọakụ.

Gọọmentị siri na ọ bụ maka na ndị mmadụ na-ebupu ego na mba ndị ọzọ.

Mana ụfọdụ ndị mmadụ ekwenyeghị n'okwu ha, ha kwuru na ọ bụ maka ọrụ na mwụlite adịghị n'obodo.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: