You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Catholic Church: Ụmụnne Fada Clement Ugwu ji anyammiri bụọ ndi gburu ya ọnụ
O meela otu ọnwa achọtara ozu Fada Clement Ugwu ebe ndị ntọ gburu ya tufue ozu ya n'ime ọhịa n'Enugwu, mana ibe akwa na iru uju ka juputara n'obi ụmụnne ya.BBC gara n'Ibite Uwenu,Awhum dị n'Enugwu steeti bụ obodo Fada Clementi Ugwu.
Maazi Patrick Egbujie Ugwu bụ diọkpara ezi-na-ụlọ ndị be Ugwu n'Awhum kwara akwa nke ukwuu oge ọ na-echeta ka ndị ntọrị siri gbuo nwanne ya nwoke Fada Clement Ugwu, onye bụ ọdụdụ nwa n'etiti ụmụaka iri nne na nna ha mụrụ.
Mazi Egbujie Ugwu ji anya mmiri kwuo na ndị niile kpara nkata gbuo nwanne ya Clement abụrụla ndị abụrụ ọnụ.Nwanne Nna Clement bụ mazi Leonard Ugwu kwuru na ogbugbu ndị omekaome gburu Fada Clement Ugwu bụ ihe mgbawa obi kacha wee wute ezi-na-ụlọ a , were kwue na ha chọrọ ihụ isi ihe mere ndị gburu Clement jiri kpaa arụ ahụ.
Ndị Awhum ka nọ n' iru uju maka ọnwụ Clement Ugwu, nke na ọtụtụ mmadụ ka na-abịa n'ụlọ ha maka ọnọdụ omenala iru uju.Fada Clement Ugwu bụ onye amụrụ na Ibite Uwenu n'Awhum, Enugwu Steeti, ebe ọ bụ nwa nke iri nna ya bụ Catechist mụtara.Ochiri ụkọchukwu katọliki na afọ 2010.
Fada Clement onye ndị mmadụ na etu"Rapụlụchukwu okwu" zutere ọnwụ ya na parish ya bụ St. Marks Obunofia dị n'Ezeagu, oge ndị ntọrị tọrọ ya ma gbagbue ya.Ahụzrị ozu Fada Clement Ugwu n'ime ọhịa ebe orerichara ka out izu uka gachara.
Bishop Callistus Onaga nke Enugwu Diocese du ndị ụka nakwa ndị echichi ibe ya kwanyere ya ugwu ikpeazu na March 21 ma donye ya n'ili na Holy-Ghost Cathedral, Enugwu.Ndị uweojii n'Enugwu ekwola na ha anwụdela ndị ọjọọ gburu Fada Clement Ugwu.