Oyetola ka ga-anọkwa n'ọkwa ruo mgbe Ụlọikpe kpebiri - Agbakoba

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọnọdụ Ademola Adeleke bụ onye ji ọkọrọtọ PDP were mee ntuliaka nke ndị Gọvanọ n'Osun steeti gbagwojuru ọtụtụ mmadụ anya ụgbụa.

Ebe ọtụtụ na-asị na ya bụ mmeri Adeleke meriri n'ụlọikpe ehibere maka ikpezi okwu dapụtara n'etiti ndị ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ekwuchaa ọgwụ.

Nke bụ na onweghi ihe ọ fọrọ ka ya bụ nwanne nna Davido rigoro na ọchịchị.

Ụfọdụ na-ekwu na ụlọikpe ikpe mkpegharị nke Adegboyega Oyetola APC wegara ya bụ ikpe nwere ike ịtụgharị ya.

BBC Igbo kpọtụrụ okaikpe ukwu bụ Olisa Agbakoba ịmata ka ihe siri kwụrụ na ya bụ okwu.

Agbakoba kwuru n'ezie na Adeleke meriri ya bụ ikpe na ụlọikpe, mana Oyetola ewegala ya bụ okwu na ụlọikpe mkpegharị.

O kwuru na "iwu nyere Oyetola ohere ịnọ na ọkwa dịka Gọvanọ Osun steeti ruo mgbe ụlọikpe mkpegharị ga-ekpebi ya bụ ikpe."

Ọ sịkwa na ọ bụrụ na ya bụ Oyetola emerie na ogogo ahụ na ọ ga-achiri gawa ruo mgbe ọ chizuru afọ anọ ya.

Akụkọ ga-amasi gị

Lee ihe nkiri anyị