Linda Ikeji amụọla nwa mbụ ya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Linda Ikeji bụ onye nwe ihe e ji agbasa ntaakụkọ dị icheiche amụọla nwa mbụ ya n'ụlọọgwụ na mba Amerịka n'ụbọchị 17 nke ọnwa Septemba 2018.

Linda depụtara afọ ojuju ya n'ozi o dere n'akara soshal midia nke Twitter ya.

N'ọnụ ya "Chukwu nna, abụrụla m nne. Baby J abịala ụwa, a mụrụ ya taa."

Ndị mmadụ jisiike ekele ya ma na-asị nwa ya nnọọ.

Amabeghị ma ọ bụ nwoke ka ọ bụ nwaanyị ka ọ mụrụ, mana a na-anụ kepu kepu na ọ mụrụ nwoke.

Cheta na Linda gbawara 'internet' mgbe akụkọ pụtara na ọ dị ime, ebe rue ugbua, amagbeghị onye tụwara ya ime.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: