You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
MASSOB: Anyị kwụ Bianca n'azụ - Uwazuruike
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa taa:
MASSOB akwadola Bianca Ojukwu
Onyeisi ndị MASSOB bụ Ralph Uwazuruike ekwupụtala nkwado ya n'ebe nwunye Ojukwu bụ Bianca Ojukwu nọ n'ịzọ ọkwa Sineti ndị Anambra Saụt.
Uwazuruike sị na ọ mere nke a n'ihi mmekọrịta dị n'etiti ya na Odumegwu Ojukwu mgbe ọ ka nọ ndụ.
Kwụsịnụ inyocha ọbaego ndị mmadụ - Idris
Onyeisi ndị uweojii bụ Idris Ibrahim n'iji chekwa ugwu ruru ndị oweojii na Naịjirịa, adọọla ndị ọrụ nchekwa FSARS aka n'antị ka ha kwụsị enyocha ọbaego, ekwentị nakwa igwe kọmputa ndị mmadụ na anataghi ikike n'ụlọikpe.
Idris kwuru na ọnye ọbụla mere nkea ga-achọrọ ụzọ ụla.
Akụkọ si mba Sudan
Mmadụ iri na itoolu anwụọla mgbe obere ụgbọelu bụ ndị mmadụ sọbara isi n'ime mmiri dị na mpaghara ndịda Sudan.
Naanị mmadụ anọ gụnyere ụmụaka abụọ zọrọ ndụ, ebe onye Bishọp ụka Angịlịkan so na ndị nwụrụ anwụ.
N'egwuregwu
Onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ mba Libya bụ Adel Amrouche arịọla ndị Naịjirịa mgbaghara maka ikwu na ha ji ọgwụ agba bọọlụ.
Amrouche kwuru na ọ bụ egwuregwu ka ọ n-ekwu mgbe o kwuru okwu ahụ.
Nkeji abalịa
Ihe nkiri nke taa:
Ndị agha Naịjirịa eweela iwe ọkụ
Ndị agha Naịjirịa eforola ntutu taa na oge erula mgbe ha ga-akwụsị ogbugbu ndị mmadụ nke ndị ọchịehi na-egbu na Platu steeti.
Onyeisi agha a kporo operation safe Haven bụ nke a na-eme na mpaghara ahụ bụ Major General Augustine Agundu kwuru na o zuola.
Naịjirịa
Nwa Chukwuemeka Odumegwu-Ojukwu bụ Chukwuemeka Odumegwu-Ojukwu Jr. ekwuola na nsogbu ha nwere ebe nwunye nna ha bụ Bianca nọ bụ na o were akụnaụba nna ha, ya kpatara ha agaghị akwado atụmatụ ya ịzọ ọchịchị.
Agbanyeghi nsogbu ndị a, ndị ihe Bianca na-amasị agbarala ya akwụkwọ ịzọ ọkwa sineti n'Anambara Saụt n'okpuru pati APGA.
Akụkọ mba ofesi
Mba Nọt Koriya emela mmemme ndị agha ebe oro ruru afọ iri asaa e kewapụtara ya bụ mba a na-akpọ Democratic People's Republic of Korea.
Ndị mmadụ na-elele ya bụ mmemme ka a mara ka a ga-ahụ ngwọagha nuklia ọbụla mana o nwebeghi nke a hụrụ.
N'egwuregwu,
Naomi Osaka bụ onye mba Japan emeriela Serena Williams n'asọmpi US open.
Nke a bụ mbụ onye mba Japan na-enweta ụdị mmeri ahụ mana Serena Williams bụ onye Osaka na-elegara anya were oke iwe oge ha na-asọmpi ahụ.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: