You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Nwunye Ojukwu ị banye sineti ga-akwalite aha Ikemba'- Onyeisi APGA
Akụkọ na-eru anyị aka ugbua na-ekwu na aka chiburu Imo steeti bụ Ikedi Ohakim eweputala ndị oke ọgaranya n'ala Igbo ruru iri na ise ka ha kwado Bianca Ojukwu nwunye onye ndu Biafra nwuru anwụ n'ịzọ oche sineti ga-anọchịte anya Anambra Saụtụ na ntuliaka 2019.
O kwuru na ndị Igbo agaghị a nọ na-ele anya akaja nwunye Dike Biafra bụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu.
O kwuru nke a n'Ekwulobia dị n'okpuruọchịchị Aguata mgbe ha na-eme ọgbakọ ndị ọnụ na-eru n'okwu na pati APGA.
Okwuru na steeti dika Imo, Abia, Ebonyi nakwa Enugwu na-ayọ ndị Anmabra ka ha mezuo ebum no obi amaka ncheta Dike Biafra bụ Ojukwu.
Mana Chris Nkwonta bụ onyeisi ndị APGA n'Anambra steeti ekwuola na ọ bụkwa onye ọ bụla bụ onye Igbo kwesiri ị kwado Bianca Ojukwu n'ihi na anyị niile bụ ọgaranya n'oke anyị.
O kwuru na ọ ga dịmma ma enye Bianca ezigbo nkwado ka owee zọta ọche sineti ị nọchite anya Anambra saụtụ site na pati APGA.
Gbasara ndị ya na Bianca na-azọ ya bu oche bụ Ifeanyi Ubah nakwa Nicholas Ukachukwu, Nkwonta kwuru na ha bụ dike mana agbanyeghị nke a onye bụ uche Chukwu banye ya bụ oche sineti.
Gere ihe ndị ọzọ o kwuru ebe a :
Na Soshal midia:
@umeh_oge kwuru na ihe a bụ ihe di mma
@OKEKEOLIVER2 kwuru na ọ ga-akamma ka enye Bianca oche ọchịchị kama ya ịzọ ọchịchị.