Boko Haram: Ndị agha ụgbọelu awakpoola ọhịa Sambisa

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Ndịagha ụgbọelu awakpoola Sambisa

Ndị agha ụgbọelu Naịjira

Ebe foto si, Getty Images

Ndị agha ụgbọelu Naịjirịa nke operation LAFIYA DOLE ekwuola na ha agbasala ebe nzuzo ndị Boko Haram dị na Kollaram, Bula Korege nke ime oke ọhịa Sambisa.

Ọnụ na-ekwuru ndị agha bụ Ibikunle Daramola kwuru na nke a mere ụnyaahụ bụ abali asaa ọnwa Seputemba.

FSAR ga na-eyi uwe ndị uweojii - Idris

Uweojii Nigeria

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii nụchatara maka mwakpo ndị ọchị ehi na-eme na Shaki dị n' Oyo steeti

Onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris enyela iwu ka ndị ọrụ nchekwa FSARS kwụsi ị na-eyi uwe na abụghị nke ndịuweojii na-arụ ọrụ.

O kwuru nke a site n'ọnụ Adepoju Ilori bụ onye na-ahụ maka FSARS na mpaghara ndịda anyanwụ nke Naịjirịa.

Akụkọ si mba Egypt

Mba Egypt

Ebe foto si, EPA

Mba egypt amaala mmadụ iri asaa na ise ikpe ọnwụ ma tụọ ihe mmadụ iri anọ na asaa mkpọrọ ọka ndụ ha niile maka ọgbagbara mere n'afọ 2013 mgbe achụpụrụ onyeisiala bụ Mohammed Morsi.

Ndị amara ikpe a bụ ndị okpukperechi alakụba, ndị ụlọọrụ Amnesty international akatọọla ya bụ ikpe ma kwuo na o megidere iwu na-achi mba Egypt.

N'egwuregwu

Super Eagles

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Super Eagles nke Naịjirịa ji ọkpụ atọ a na-asataghi otu merie ndị Seychelles n'asọmpiitozuoke n'iko mba Afrịka.

Ahmed Musa, Chidozie Awaziem na Odion Ighalo so na ndị nyere goolu ndị ahụ.

Nkeji nke abalịa

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke abalịa

Aha onyonyo, Ụzọ ọjọọ egbuola anyị - Ndị ọkwọ ụgbọala

Ọnọdụ ụzọ ndị dị na mpaghara ọwụwanyanwụ nke Naịjirịa na-agbazi ndị ọkwọ ụgbọala anya mmiri.

Omotala Jelade Ekeinde ebeela akwa maka Leah Sheribu

Onye na-eme ihe onyonyo a ma ama bụ Omotala Jelade Ekeinde etinyela ọnụ n'okwu gbasara nwantakịrị nwaanyị ndị Boko Haram tọọrọ kamgbe bụ leah Sharibu.

Omotola

Ebe foto si, Getty Images

Omotala kwuru na ọ ga-abụ ihe ịgba anya mmiri ma ihe ọjọọ ọbụla me ya bụ nwa bụ onye Boko haram ji maka okpukpe ya.

Naịjirịa

Aka chịburu Sokoto steeti bụ Attahiru Bafarawa gara Owere ụnyaahụ.

Attahiru Bafarawa

Ebe foto si, Attahiru Bafarawa-Facebook

Nkọwa foto, Attahiru Bafarawa chịburu dịka gọvanọ Sokoto

Ọ gara ịchụ nta vootu maka ọkwa onyeisiala ọ chọrọ ịzọ na 2019, nọrọ ebe ahụ kwuo enyegodi na onyeisiala Muhammadu Buhari afọ 20 , o nweghi ihe kwesiri idozi akụnaụba Naịjirịa.

Akụkọ mba ofesi

Ọ bụrụ na ọnụ gị ezughi ike, o nwere ike ibuba gị nga.

George Papadopoulos

Ebe foto si, Twitter/@GeorgePapa19

Nkọwa foto, Papadopoulos kwuru na a gwara ya na ndị Rọshịa nwere atịtị ha ji gbasara Hillary Clinton

Onye kwutere ihe Amerịka jiri bido inyocha Rọshịa maka ntuliaka ya na 2016 bụ George Papadopulous abala nga mkpụrụ ụbọchị iri na anọ.

N'egwuregwu,

Ajentina egosila na ma Messi anọ ya ma ọ nọghị ya, ha na-eme ihe siri ike.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Giovanni Simeone na Gonzalo martinez nyere goolu ọkpụ atọ asataghị otu n'asọmpi enyi na enyi ha na mba Guatemala gbara.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo, 'Restructuring' ka mma karịa referadum