Anyị nwere ikike ịkpụpụ ndị omeiwu hapụrụ APC ụlọikpe - Lai Mohammed

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Gọọmenti etiti etinyela ọnụ na ndị hapụrụ pati APC.

Anyị na-ebido na gọọmenti etiti bụ ndị kwuru na ha nwere ikike ndị omeiwu pụrụ na pati APC ụlọikpe ma mkpa ya dị.

Lai Mohammed kwuru nke a taa ka ndị ntaakụkọ jụrụ ya ihe ha ga-eme gbasara ndị omeiwu ahụ gbara ha alụkwaghị m.

Naịjirịa

Ndị ụlọọrụ kọstọm chọrọ ịchụ mpụ na ahịa iwu ọsọ.

Ụlọọrụ na-ahụ maka mbubata ihe na Naịjirịa na ibupu bụ Kọstọm na Bekee emeela nchịgharị ime ụlọ.

Ha wegharịrị ndị ọrụ ha mmadụ iri asaa maka iluso ahịa iwu na mpụ ọgụ na ngalaba ahụ.

Akụkọ mba ofesi

Otu mbaụwa United Nations ekwuola na mmadụ otu puku na narị ise ndị mbịara mbịara nwụrụ ebe ha na-achọ ife mmiri Mediterranean.

N'ọnwa Juunu na Julai, mmadụ nari asatọ n'ise nwụrụ nke mere mmiri Mediterranean ji bụrụ mmiri kachasị egwu na mbaụwa.

N'egwuregwu,

N'egwuregwu, otu egwu bọọlụ Indomitable Lions nke Kameruun enwetaal onye nkuzi ọhụrụ.

Ọ bụ Clarence Seedorf na Patrick Kluivert ga-abụ onye nkuzi na osote ga-akwado ha maka asọmpi Afcon 2019.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ihe nkiri nke taa: