Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: PDP a ga-eso eme ntuliaka 2019?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Isiokwu ndị dị mkpa n'ụtụtụ a

Gbasara PDP na ntuliaka 2019

Site n'ọnụ onyeisioche ha bụ Uche Secondus, ndị otu PDP ekwuola na ha nwere ike ghara isonye na ntuliaka a ga-eme na 2019.

Secondus kwuru na ntuliaka e mere n'Ekiti mere ka okwukwe ha nwere n'ime otu Inec fuo.

O kwukwara na ihe Inec na-eme edoghị ha anya, na ha amaghị ma ha a ga-arụnwu ọrụ ha na-enweghị ihu abụọ.

Okonjo-Iweala na Twitter

Ihe ọma emeerela nwaafọ Igbo bụ Ngozi Okonjo-Iweala, ka Twitter mere ya otu n'ime ndị isi oche.

Ngọzị sara sị na obi dị ya ụtọ

Na mba ofesi,

Anwụchiela dọkịnta Denis Furtado bụ onye gburu nwaanyị ukwu sara mbara na-adị mma gakwuuru ya inweta otele ukwu. A ga-ekpe ya ikpe dịka onye ma ụma gbuo mmadụ.

Ebe ụgbọmmiri bu ihe ruru mmadụ iri atọ na otu dara mmiri ma gbuo mmadụ asatọ n'elu mmiri Missouri dị na mba Amerịka.

Ndị Naịjirịa nọ na Rọshịa

Ozi anyị nwetere n'abalị ụnyaahụ kwuru na ụgbọelu gọọmentị Naijiria zigara mba Rọshịa ibulata ụmụ Naịjirịa tọrọ atọ eruola, ebe ihe karịrị otu narị bụ ndị mbụ n'ime ha eruola ọdọ ụgbọelu ịkwado maka ịlota Naịjirịa taa.

Cheta na mmadụ karịrị 200 tọrọ atọ na Rọshịa dịka emechiri asọmpị Iko Mbaụwa na Rọshịa ụbọchị ole na ole gara aga.

Ụfọdụ kwuru na e gwuru ha wayo n'ikagbu akwụkwọ njem ha bụ 'ticket' na bekee n'agwaghị ha.

N'egwuregwu

Otu Liverpool esila n'aka ndị AS Roma zụọ ochee goolu Alisson, nke mere na ọ bụzị oche goolu kacha adaọnụ n'ụwa.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Lee ihe nkiri nke taa