You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'abalị a: Ọdụm adọgbuola mmadụ abụọ
Ọdụm adọgbuola mmadụ abụọ
Ọdụm adọgbuola mmadụ abụọ na mba Saụt Afrịka n'ogige anụmanụ 'South African game reserve.
Ndị na-elekọta anụmanu kwuru na ha hụrụ ozu mmadụ abụọ ahụ bụ ndịnta na egbe ji n'ime ụlọ ọdụm.
APC Imo steeti ga-eme ntụliaka imeụlọ
Ụlọikpe ukwu nọ n'Owere, Imo steeti, akagbuola ntuliaka imeụlọ APC mere na steeti ahụ.
Ụlọikpe nyekwara APC iwu ka ọ gbaa mbọ megharịa ntuliaka ọhụrụ na steeti ahụ.
Adamu Ciroma alaa
Adamu Ciroma bụ onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka ego nakwa onyeisi ụlọakụ etiti nke a kpọrọ CBN n'aha ịchafụ, anwụọla.
Ciroma dị afọ iri asatọ na itoolu nwuru n'Abuja taa ka ọ rịachara ọrịa ogologo oge.
Kedu mgbe mmekpa ahụ sị n'aka ndị uweojii ga-akwụsị
Ezinaụlọ Igwetu Linda bụ nwata ahụ na-efe ala Naịjirịa ndị uweojii gbagburu n'Abuja na Wenezde ekwuola na ha a chọrọ ikpe ziri ezi gbasara ya bụ okwu.
Nwanne ya bụ Amara Igwetu gwara BBC Igbo na ha anabataghị ihe ndị uweojii kwuru.
Diego Maradona arịọla arịrịọ
Onye egwuregwu bọọlụ a ma ama bụ Diego Maradona arịọla otu FIFA arịrịọ maka okwu o kwuru na a ghọgburu Ajentina n'asọmpị ha na Ingland mere n'iko mba ụwa.
Cheta na Maradona dere na Twitter na ogbu-bọọlụ n' asọmpị ahụ bụ onye mere e jiri merie Ajentina na ya bu asọmpi.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Lee ihe nkiri anyị