You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Buhari ebinyela aka n'iwu ịkpachi ego Naijiria e zufuru
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ebinyela aka n'akwụkwọ ka gọọmenti nwee ikike ịkpachi akụ na ihe onwunwe ndị a na-arụ aka imefu ego Naijiria.
Iwu ọhụrụ ahụ kwuru na a ga-ejichi ihe niile nwaafọ Naijiria bụ onye ọrụ gọọmentị maọbụ onye nọ n'ọkwa ọchịchị nwere n'ala Naijiria ruo mgbe ikpe gbasara ya biri n'ụlọikpe.
Onyeisiala Buhari kwupụtara nke a n'igwe okwu Twitter, kwuru na nke a bụ iji kwudosie ike n'ọgụ megide nrụrụaka iji hụ na ndị tinyere aka na mpụ alaghị n'efu.
O kwuru na iwu ọhụrụ ga-anapụ ndị tinyere aka na mpụ akụ ha kpatara n'ụzọ akwụghị ọtọ, iji gbochie iji ya eduhie ndị na-eme nnyocha maọbụ ikpe.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: