You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'abali a: Trump na China na-ama aka n'ihe gbasara azụmahịa
Akụkọ kachasị mere taa;
E mewaala ndị Ijipt obi
Ndị Ijipti ebeela akwa arịrị ka ndị mba Yuregụaị meriri ha n'asọmpi abụọ nke Iko Mbaụwa a gbara taa.
Onye egwu bụ Jose Gimenez nyere goolu na nkeji iri itoolu, mewara ndị Ijpti obi ma mee ka ọtụtụ buru aka n'isi.
Ọkaiwu Evans eserela aka
Akụkọ anyị na-anụ ugbua bụ na Olukoya Ogungbeje bụ onye ọkaiwú Chukwudumeme Onwuamadike nke a ama dịka 'Evans' bụ onye a na-enyocha maka ịtọ mmadụ, esila n'ihe gbasara okwu ya sepụ aka.
N'ime akwụkwọ Ogungbeje depụtara, o kwuru na ọ bụ maka ebumnuche ihe gbasara ya ka o ji mee nke a.
Trump na China a na-ese okwu?
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ ga-atụkwasị ego ụtụ ruru pasentị iri abụọ na ise n'elu ngwaahịa ndị si China.
O kwuru nke a ka ọ na-ebo ndị Beijing ebubo maka izu ihe mmepụta ọnatarachi nke bekee 'intellectual copyright theft'.
Ndị Naịjịrịa chọrọ ịnwụ ọkụkọ gaa Rọshịa
Mba Rọshịa machiri ndị nkwado otu Super Eagles chọrọ iji ọkụkọ gaa n'ama egwuregwu maka asọmpi Naijiria nwere na ngwụcha izu a.
Cheta n'asọmpi iko mbaụwa nke afọ 2010 nke mere na Saụt Afrika, a machiri ndị nkwado Super Eagles iji ọkụkọ e tere uhie njirimara Naijiria n'ahụ banye amaegwuregwu Ellis Park dị na Johanesbọg maka asọmpi ha na Agentina.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: