You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'abalị a: Donald Duke agụnyela na ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a:
Osote onyeisiala mezuru ọchịchị onyeisi ya agaghị azọlizi ọkwa onyeisiala karịa otu ugboro.
Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyela aka n'iwu na-akwụsị osote onyeisila ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala karịa otu ugboro ma ọbụru na o mezuru ọchịchị onyeisiala ya.
Nke a pụtara na onwere ihe mere onyeisiala jiri pụọ n'ọchịchị n'oge na-erughi eru, osote mezuo oge ọchịchị ya, ọ gaghị azọli ọkwa onyeisiala karịa otu ugboro.
Naịjirịa
Donald Duke esonyela n'ọsọ ọkwa onyeisiala.
Aka chịburu Cross River steeti bụ Donald Duke ekwupụtala ebumnobi ya ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala n'afọ 2019.
O kwupụtara ebumnobi ya n'Anambra steeti ụnyaahụ ebe ọ gara ịgwa ndị ọkaiwu okwu.
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Onyeisiala Buhari ga-aga Moroko echi.
Onye nkwuchite ọnụ onyeisiala bụ Garba Shehu kwuru na onyeisiala Moroko bụ Eze Mohammed nke isii bụ onye kpọrọ ya ka ọ bịa.
Akụkọ mba ofesi
Trump esila n'ọgbakọ G7 pụọ.
Donald Trump ahapụla ọgbakọ G7 na-eme na Kanada gawa Singapore.
Ya na ndị mba ọzọ na-akwata ya maka ihe gbasara azụmahịa n'etiti ha.
N'egwuregwu,
Ndị Super Eagles nwere onye ọbịa nọnyere ha ebe ha na-akwado asọmpi Iko Mbaụwa.
Nwafọ Naịjirịa na-agbara mba Ọstrịa bọọlụ bụ David Alaba gara hụụ ndị Super Eagles ebe ha nọ akwado asọmpi Iko Mbaụwa.
Alaba kelere ndị Naịjịrịa maka nkwado ha na-akwdo ya ma kpekwara ndị Super Eagles ekpere mmeri.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa: