Nwa afọ, Chiwetel Ejiofor ga-eso n'ihe nkiri 'Maleficent 2'

Nwa afọ Igbo bụ Chiwetel Ejiofor na onye ihe nkiri a ma ama bụ Angelina Jolie ga-eso na agba nke abụọ ihe nkiri, "Maleficent" nke ụlọọrụ Walt Disney na-ewepụta.

Dịka ụlọọrụ Disney siri kọwaa, e bidola mmepụta ihe nkiri ahụ nke onye nhazi mmepụta ya bụ Joachim Rønning.

Ihe nkiri a ritere ego kariri nde dọla 750 ($750m) oge e meburu ya na mbụ.

Ndị ọzọ kara aka ga-eso n'ihe nkiri ahụ bụ Michelle Pfeiffer, Harris Dickinson na Robert Lindsay so n'ihe nkiri ahụ Walt Disney mepụtara mbụ n'afọ 2014.

Chiwetel Ejiofor, a mụrụ na mba Briten wara ka ọnwa afọ ole na ole gara aga oge ọ pụtara n'ihe nkiri a kpọrọ,"12 Years a Slave".

Ejiofor eritela ọtụtụ nturugo n'ime ihe nkiri gụnyere 'Laurence Olivier' n'afọ 2008, 'BAFTA Orange Rising Star' n'afọ 2006 nakwa mkpọpụta aha ugboro abụọ maka nturugo 'Golden Globe.'

Akụkọ ndị ga-amasị gị: