You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị taa: 'Ọkaikpe na-ekpe IPOB kwunyere Gọọmentị'
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Rochas na-arịọ Buhari
Aka na-achi Imo steeti bụ Rochas Okorocha ji ọsọ gaa Daura be onyeisiala Muhammadu Buhari ụbọchị.
Ọ gara ịrịọ onyeisiala ka ọ kagbuo nhọpụta otu pati APC Imo steeti mere ụbọchị Satọdee maka na ọ dara ada.
Otu IEI
Otu a kpọrọ Igbo Ekunie Initiative ekwupụla iwe ha etu onye ọkaikpe Binta Nyako si ekpe ikpe ndị IPOB na Nnamdi Kanu na ezinaụlọ ya.
Ha kwuru na iwe ha bụ na Binta nwere ebe ọ kwunyere dịka ha boro ya na ọ bụ ebumnuche ndị gọọmenti ka ọ na-eme.
Na mba ofesi, aga-edu Putin'iyi ọrụ taa
A ga-edu onyeisiala mba Rọshịọ bụ Vladamir Putin iyi ọrụ taa maka ọchịchị ya nke ugbo anọ dịka onyeisiala mba ahụ.
Mmeri o meriri na ntuliaka ha ga-eme ya afọ iri na asatọ ọ bụrụla onyeisiala mana ndị na-anọghị n'ọchịchị sị na ọ bụ onye aka ike
N'egwuregwu
Otu onye egwu bọọlụ Super eagles bụ Leon Balogun ekwuola ka ndị ha nọrọ n'ahụ isi ike maka asọmpi iko mbaụwa na-abịa.
Asọmpi ahụ na-ebido n'ọnwa na-abịa bụ Juunu na Rọshịa.
Nkeji nke ụtụtụ a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Ihe onyonyo taa
Asambodo gị ọ na-enye gị nri? Ụfọdụ ndị Naịjirịa ekwuputela obi ha gbasara Asambodo agụmaakwụkwọ ha.