You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Cardiff city abaala Premier Lig
Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a: Egburu ọchụ na Birnin Gwari ọzọ.
Ndị nche obodo na ndịagha Naịjirịa ebupula ozu ruru iri anọ na ise n'obodo Gwaska ebe ndị omekome wakporo Birnin-Gwari ọzọ.
Agbakwara ụfọdụ ụlọ obibi ọkụ ma na-atụ egwu na a ga-achọta ozu ndị ọzọ n'ọhịa.
Ebe ọzọ na Naịjirịa.
Ihe iru uju emetụtala ndị uweojii ka mmadụ ise ndị uweojii nọ n'ọzụzụ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ.
Mmadụ ise a nwụrụ ka ụgbọala ha ji eme njem nwuuru ọkụ n'okporoụzọ Kano-Zaria ka ha nọ na-alaghachi ebe obibi ha.
Akụkọ kwuru na ha chọrọ ịlaru ụlọ maka ọbere ezumike ha nwetara n'ụlọakwụkwọ tupu ihe mberede a emee.
Na Mba ofesi,
Ide mmiri sitere n'oke mmiriozuzo emerụọla mmadụ isii ahụ na mba Turkey.
Ide a burukwara ụfọdụ ụgbọala ma mebie ọdọ ahịa dị icheiche n'isi obodo Turkey bụ Ankara.
Enweghị onye nwụrụ n'ime ide a.
N'Egwuregwu,
Ka a na-ahazi ọkwa Premier League maka imechi asọmpị ahụ, ka a na-ahụkwa ndị mmeri na ndị emeriri.
Cardiff City esonyela na ndị a ga-ebuba n'ọkwa Premier League ugbua, ebe otu bọọlụ Birmingham meriri Fulham
Gee nkeji anyị na mgbede a: