Onyeisiala Buhari ga-aga njem ọrụ na UK taa

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-ahapụ Abuja ebe ọ ga-esi agaru mba Britain echi.

Onye na-ekwuchitere onyeisiala n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu, kwuru nke a n'ihe ndepụta o tinyere na Twitter taa.

Shehu kwuru na Buhari ga-aga UK taa ebe ya na Theresa May bụ Praim Mịnịsta ndị Briten ga-ezute iji nwee mkparịtaụka maka mmekọrịta Naịjiria na Briten.

Nzukọ ha na-abịa tupu ndị isi gọọmentị ndị nọ na Commonwealth ebido nzukọ nke ha ga-ebido site na 18 ruo 20 nke ọnwa Epreelụ 2018.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Shehu kwukwara na Buhari ga-ezute onyeisi Royal Dutch Plc bụ Ben van Beurden, gbasara atụmatụ itinye ijeri dọla 15 ha na Shell na ndị ọzọ chọrọ ime n'ụlọọrụ mmanụ agbịdị Naịjiria.