Ndị uweojii anwụchiela mmadụ 7 ka egbuchara mmadụ 17

Ndị uweojii kwuru na ha nwụchiri mmadụ asaa ha na-enyo so na ndị zuru ohi n'Offa dị na Kwara steeti.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii ndị Kwara steeti bụ Okasanmi Ajayi, gwara BBC na ndị ohi a gburu mmadụ iri na asaa (17) ka ha wakporo ọtụtụ ụlọakụ n'Offa ụbọchị Tọọsde.

Ajayi kwuru na ndị a nwụrụ anwụ gụnyere ndị uweojii itoolu na ndị nkịtị asatọ.

O kwuru na ọbụghị mmadụ iri atọ (30) nwụrụ dịka ndị ntaakụkọ si kwuo, kama na enwere ndị merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ n'Offa nakwa University of Ilorin Teaching Hospital.

Akụkọ ga-amasị gị

Ajayi kwuru "Anyị anwụchiela mmadụ asaa anyị na-enyo enyo. Anyị enwetala ụgbọala asaa na ụfọdụ ekwentị ndị ohi a ji mee mwakpo a."

Akụkọ kwuru na ndị bịara zuo ohi otu elekere (site n'elekere anọ ruo ebe elekere ise) a ruru mmadụ iri atọ.

Tupu ha ebido mwakpo ha, ha bu ụzọ nọchie ụzọ ma wakpoo ụlọakụ na ụlọọrụ ndị uweojii nọ ebe ahụ ebe ha gburu ma otu onye uweojii dị ime.

Onyeisi ndị uweojii Naijirịa ezigala ndị ọkachamara n'obodo Offa ime nyocha nakwa imepe obodo ahụ ka ndị mmadụ nwee ike laghachị etu ha si ebibu.