You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Newcastle emeriela Man United n'iko Premier League
Newcastle emeriela Manchester United n'asọmpị iko Premier League nke agbara na Sunday.
Nke a bụ nke mbụ Newcastle merịrị Man United ke mgbe ọnwa Ọkụtoba nke afọ 2017.
Matt Ritchie onye otu Newcastle bụ onye nyere otu goolu n'asọmpi nke a.
Nke a emeela ka ha pụọ na 'relegation'.
Dike na dimkpa ọhụrụ Newcastle
Ugbua, onweghị maachị ọbụla Man United merịrị n'asọmpị Premier League n'afọ nke a.
Onye nche bọọlụ ọhụrụ nke otu Newcastle bụ Martin Dubravka bụ onye gbarambọ hụ na Man United enyeghị goolu ọbụla.
O nwere olileanya?
Maka ihe a mere, Man United, ọ dịzịka Manchester City ga-abụ otu ndị mmerị iko Premier League afọ nke a.
Mana tupu ha aṅụrịwa, ha kwesịrị ị merị Manchester United na asọmpị ga-eme na stadiọmụ Etihad n'ụbọchị asaa n'ọnwa April (7-4-18).
Abụ mmeri Newcastle
Onye nkuzi Manchester United bụ Jose Mourinho kwuru na ndị Newcastle lụrụ ọgụ dika ndị anumaanụ n'egwuruegwu taa.
Onye nkuzi Newcastle bụ Rafael Benitez nwere olileanya na nbinye aka n'akwụkwọ ha na Islam Slimani mere ga-ebute mmerị di iche iche n'odinihu.