Lai Mohammed: Amaghị m na EFCC na-enyocha Yusuf

Ebe foto si, AFP
Lai Mohammed kwuru nke a n'ụbọchị Wenezde mgbe ọ na-asa ndị ntaakụkọ okwu ka emechara nzukọ ndị ime obi nke gọọmentị etiti.
O siri na ọ maghị na ngalaba na-ahụ maka ibu agha megide mpụ na mmerụaka na-enyocha onyeisi ngalaba gọọmenti na-ahụ maka ịnshọransị ahụike bụ Usman Yusuf, maka ebubo eboro ya.
Na'afọ gara aga, Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Prof. Isaac Adewole, kwụsịrị Yusuf ọrụ n'ike ganye mgbe EFCC ga-emecha nyocha ebubo na o (Yusuf) mefuru nde otu narị iri itoolu na otu naira na mpụ ndị ọzọ.
Mana onyeisi ala bụ Muhammadu Buhari nyere iwu ga-akpọghachi ya n'ọrụ.
Lai Mohammed sịrị: "Amaghị na EFCC na-enyocha Yusuf onye nke akpọghachiri n'ọrụ. Ma ka o si na dị, e cheghị na mkpọghachi ya ga-egbochi nyocha ọbụla."
"Na akpọghachiri n'ọrụ apụtaghị na EFCC agaghị aga n'ihu na nyocha ya."




