You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Itoro-Eze-Anaba: Ekwentị m na-akụzi akwụsi akwụsị
Ezenwaanyị England akpọrọ Queen Elizabeth nke abụọ e tuola onyeisi Mirabel centre bụ Itoro Eze-Anaba ugo akpọrọ Commonwealth point of Light award.
Mirabel centre bụ ngalaba n'ahụ maka ndị awakporo awakpo ma na-enye ha ohere ibi ndụ nkeọma.
Joseph Abuku bụ ọnụ na-ekwuputara British High Commision na Naịjirịa kwuru nke a.
Abuku si na Eze-Anaba, onye bụ nwunye onye mgbasa ozi akwụkwọ akpọrọ Vanguard nwetere ihe nrite a n'emume British High commisioner na Naịjirịa bụ Paul Arkwright chịkọbara.
Akwụkwọ ahụ kwuru na Eze-Anaba bidoro Mirabel Centre bụ ulọ nke mbụ ebe ndị a awakporo ga-enweta enyemaka n'afọ 2013.
Kemgbe ahụ, onyerela ndị awakporo ruru puku atọ na otu narị aka.
N'ọnụ Arkwright:" Itoro egosila uchu na-enweghị atụ n'ikwado ndị awakporo awakpo. O nyela ihe karịrị mmadụ puku abụọ na narị asatọ (2800) laferela ihe arụ dị icheiche
ma kwado kwa ndị awakporo n'ikwuputa ihe mere ha nakwa ikpesa onye wakporo ha ka ndị nwakpo belata."
Mirabel centre bụ aka ọrụ nke 'Partnership for Justice' ebe ndị awakporo na-aga enweta ihe gbasara ahụ ike na ndụmọdụ.
KEDU KA OBI DỊ ITORO EZE-ANABA
Itoro gwara BBC Igbo n'ekwentị na ya bụ ihe nrite ebuputela nke ukwuu nke mere na ekwenti ya na-akụzị akwụsị akwụsị, mana obi dị ya ụtọ nihi na agha a na-ebuso nwakpo anọrọla n'ọnụ onye ọbụla.
N'ọnụ ya,"Obi dịm ụtọ na Ezenwaanyị England nyere m ihe nrite Commonwealth point of Light, ọ ga-ewulite agha a na-ebuso nwakpo ma mee ka ndị nwakpo belata na Naijịrịa ma n'ụwa.
O wekwara ohere a kelee ndị n'akwado ya ma ndị ya na ya na-arụkọ ọrụ.
Gụrụ ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ ihe nrite (award) na Twitter: