You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
SpaceX nke Elon Musk agbapụla ụgbụelụigwe ọzọ
Elon Musk bụ onye mgbere ama ama ba ụwa niile agbapụla ụgbụelụigwe ya ọ kpọrọ Falcon Heavy.
Falcon Heavy si Kenedy Sports Centre and Florida dị na mba Amerịka hepụ jewe Mars.
Nnụkwụte ụgbọelụ a - nke kachasị ike kemgbe ebidoro mmepụte ihe a na-akpọ "shuttle system" n'asụsụ Bekee - si ebe akwụbala ya hepụ.
Elon Musk sị na ya ji obi ya aka mgbe ụgbọelụ a na efepu maka ọ ma na o nwere ike gba ka ogbunigwe.
"A hụrụ ka ọ gbawara na ụche m, mana onweghị ihe ojo mere," Elon Musk kwuru.
Maka nhepụ oma mere, Falcon Heavy na ahazizi ị bụ ụgbọ a ga ejị na ebụ ụgbọelụ ndị ọzọ na-aga elụigwe.
Musk na ekwu na ụgbọelụ ha kariri rocketị bụbụ nke kachasị ike bu Delta IV Heavy ike ụgboro abụọ, agbanyeghi na ọ ka ya daa ọnụ.
Ụgbọala Musk na ihe akpịraakpị yiri ya dị na ime ụgbọelu a na eje Mars.
Rocket bu ụgbọelụigwe a laghachiri ebe ha si pụọ.