You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Naijiria: Anyi na Cameroun ga-akwụsị ndị agha oyi egwu
Onye ndụmọdụ pụrụiche nke onye isi ala Naijiria n'ihe gbasara nche obodo bụ Babagana Monguno ekwuola na Naijiria ga-enyere ala Cameroun aka ịkwụsị ihe iyi egwu gbasara idunotu nke ala ha.
O kwuru nke a maka ndị ala Kameruun a chughachịrị azụ ga ala ha.
Mongono kwuru nke a n'ọgbakọ ya na ndị nọchịtere ala Kameruun mere n'Abuja. O kwukwara na Naijiria ga-enyere Kameruun aka maka ndị agha iyi egwu na-enye nsogbu n'ala ha.
Mana ọ kọwaputaghị ihe kpatara ha ji chughachi ndi Cameroun ruru ịrị anọ sị ha lawa be ha.
O kwuru na goomentị Naijirịa agaghị ekwe ka ndị agha iyi egwu jiri Naijiria mere ebe eji aluso ala cameroun ọgụ.
Otu jikọtọrọ mba uwa niile ekwuola na obi adịghị ha nma maka ndi Cameroun gọọmentị Naijiria chughachiri azụ.
Ugbua, onweghị onye ọbula nọ na ọchịchị gọọmentị Naijiria kwetara ị za ajụjụ n'aka BBC gbasara ndị Kameruun a achụghachịrị azụ.