Eji uteọrịa bute Oliseh Metuh n'ụlọikpe

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Eji uteọrịa buru Oliseh Metuh, onye bụbụ onye na-ekwuchitere pati na-achịbụ Naijirịa bụ PDP, gaa ụlọikpe ukwu na Abuja taa.

Ụlọikpe ukwu a nke a na-akpọ Federal High Court n'asụsụ bekee bụ ebe Metuh na-aza aziza banyere ihe ọ ma maka mpụ na aghụghọ mere mgbe PDP na-achị Naịjirịa.

Onye ọkaiwu na-anọchite Metuh gwara onye ọkaikpe mgbe ikpeazụ okwu ya putara na ọ [Metuh] nọ n'ụlọọgwụ ọpụrụiche Nnamdi Azikiwe na-anata ọgwụ maka ihe mere ya n'ọkpụkpụazụ.

Onyeachi Ikpeazu, bụ onye na-edu ndị okaiwu Metuh, kwuru mgbe ahụ ka-adọtikwuo mgbe a ga-ekwu okwu Metuh na ụlọikpe aka, inye ya ohere ka ọ gaa ụlọọgwụ.

Ha gosikwara akwụkwọ onye dọkịta dere maka Metuh.

Onye ọkaikpe ekweghị, ma sịkwa na ha ga-anabata arịrịọ ndị wetere okwu rịọrọ ka-anapụ Metuh ntụhapụ enyere ya ma ọ bụrụ na ọ biaghị ụlọikpe taa.

Mana, ka ọkaikpe hụrụ Metuh n'ime uteọrịa, ọ dọtịrị ikpe a aka. Ha ga-alagachị ụlọikpe n'ụbọchị 15 n'onwa Mach n'afọ a.

Ọkaikpe kwuru sị: "A hụrụ m ọnọdụ Metuh. Maka ya, echem ka m dọtịa oge a ga-ekwu okwu a ka onwee ike nwete onwe ya, bịa zara ọnụ ya."

Ndị nchekwa nọchiri uteọrịa Metuh, ma gbochie ndị ntaakụkọ chọrọ ise ya foto, mana ọrụ nta akụkọ Punch setere otu ọfụma.