You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nwoke egbụọla ịbe ya abụọ na Saut Afịrịka
Otu na enekọrịta ndị mba Naịjirịa bi na Saut Afịrịka ekwuola na akụkọ a mere eme n'ezie
Ha kwuru na onye Naịjirịa ibe ha egbuola ndị otu ha abụọ siite n'iji mma sugbu ha n'ụzụ ụtụtụ taa.
Onye odeakwụkwọ otu ahụ bụ Emeka Ezinteje gwara ndị ntaakụkọ na ihe butere onwu ndị a bụ esemokwu ego.
Ọ sị kwa na ndị uwe ojii ebidola nyochapụta ihe mere eme na ka-osi mee.
Enyere aha ndị a nwụrụ anwụ bụ Maazi Ekwegharịrị Chịdị onye Ehime n'Imo steeti na Maazị Nzechukwu Alabuche onye Azia n'Anambara steeti.
Onye gburu ha ka-akpọrọ Sunday onye Awgbụ n'Anambara steeti kwa.
Akụkọ n'apụta kwuru na Sunday agbapụla ọsọ banye na nzizo mana ndị uwe oji n'achọ ya.
Asị na ebe nke a mere bụ na obodo Rossetinville na mpaghara ndida Johannesbọgụ bụ isi obodo Saut Afịrịka