You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Oche goolu bụ onye etulu ugo ka Naịjirịa mmeriri Angola
Onyeisi ndị ndị Super Eagles nke ụlọ bụ Ikechukwu Ezenwa bụ onye a tụrụ ugo ka onye kachasị gba bọọlu na mmeri Naijirịa meriri mba Anghola na asọmpị CHAN ụnyahụ.
Ezenwa bụ onye nke atọ na ndị egwuregwu Naijirịa enyere otu ugo kamgbe ebidoro CHAN nke afọ a.
Ezenwa na echere ndị Enyimba goolu.
Na sọmpị a, ọ chetara goolu nke oma, ma nwuchie bọọlụ na na akwadọ iba goolu ụgboro anọ.
Ana atu anya na otu Ezenwa siri sọmpị na CHAN ga eme ka o soro ga isọmpị na Russia na afọ na-abịa.
Angola bụrụ ụzọ nye goolu, mana Naijiria sara ya ma nyekwa ọzọ.
Anthony Okpotu na Gabriel Okechukwu bụ ndị nyere goolu ndị a.
Naijiria na Sudan ga sọmpị na Marrakech na Wenesde.