You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị oyiegwu IS awakpola ụlọ ọmụmụ ndị agha na Kabul
Otu oyiegwu a na-akpọ Islamic State (IS) sị na ọ bụ ndị otu ha wakporo ụlọ ọmụmụ ndị agha na Kabul.
A wakporo ụlọ ọmụmụ a na-akpo Marshal Fahim National Defence University n'isi ụtụtụ taa, ozi si mba Afghanistan na-apụta na-ekwu.
Mwakpo a na-eme n'azụ nnukwu ogbunigwe etinyere na ime ụgbọala eji ebu ndị ahụ adịghị a na-akpọ "ambulance" na asụsụ bekee, gbara wee gbuo mmadụ ruru otu nari.
Islamic State na Taliban mere mwakpo di ichiche na Kabul ọhụrụ a.
Onye ntaakụkọ BBC Mahfouz Zubaide na-akọwa na ụda egbe na ogbunigwe kpọnyitere ndị Kabul na elekere ise ụtụtụ nke be ha.
Ndị ọrụ nchekwa mechiri ụzọ niile esi eje ma pụta na-ebe ihe a na-eme, ọlụ ntaakụkọ a na-akpọ Tolo na ekwu.
Tolo sịkwa na onye na-ekwuchitere onyeisiala Afghanistan kwenyere na onwere ihe mere na mba ahụ, ma sịkwa na ndị oyiegwu ahụ kpara ike a agafeghị onụ ụzọ nke mbụ ha.
Ụlọ ntaakụkọ AFP n'onwe ha na-ekwu na ndị uweojii si na ogbunigwe elu so na ihe eji mee mwakpo a, ma n'ekwu na ebe niile adaala jụụ.
Ozi ọhụrụ pụtara na-akọwa na ndị nchekwa abụọ na ndị otu oyi egwu atọ nwụrụ na mwakpo a. Ndị agha iri merụrụ ahụ.
Anyị ga-ewetara ụnụ ozi ọzọ ma anyị nweta ya.