Grammy 2018: Amarala onye bụ dike n'ọgbọ egwu

Ebe foto si, Getty Images
Ọgbakọ na-enye ndị na-eti egwu na mba ụwa nturu ugo a na-akpọ Grammy Awards kpọtụrụ n'abalị 28 nke Jenụwarị n'ime New York dị na mba Amerịka.
Nke a bụ agba iri isii nke ya bụ ntụrụ ugo.
Onye na onye bịara?
Ndị oluọma dị ichiche kwetakwara na ha ga-abịa nturu ugo nke a ma bịakwa dịka ha si kwuo.
Ufọdụ n'ime ha bụ Elton John, Lady Gaga, Rihanna, DJ Khaled, Kendrick Lamar, Alessia Cara, Logic, Bruno Mars na Cardi B.
Ndị ọzọ bụ Miley Cyrus, Sam Smith, Pink na ndị ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images
Onye ka iwe na-ewe?
Akụkọ kwuru na ndị na-eti egwu dịka Taylor Swift, Ed Sheeran, Lorde na Justin Timberlake ekweghị aga nturu ugo nke afọ a maka na ndị Grammy leghara ha anya.
N'oge garaaga, ndi na-eti egwu dịka Frank Ocean, Justin Bieber na Kanye West ekweghi aga maka okwu ịkpa oke agbụrụ.

Ebe foto si, Getty Images
Kedụ ndị ritere nturu ugo?
Ndị a họpụtara n'agba dị icheiche a na-atụ anya na ha nwere ike itụ ugo bụ ndị a: Lady Gaga, The Weekend, Bruno Mars, Jay Z, Kendrik Lamar na Lady Antebellum.
Kama ndị nwetere ihe nrite nturu ugo bụ:
- Bruno Marsritere isii
- Kendrick Lamar ritere ise
- Ed Sheeran ritere abụọ
- Chris Stapleton ritere abụọ
- Alessia Cara ritere otu
- The Weeknd ritere otu
- Childish Gambino ritere otu
- The War On Drugs ritere otu
- Portugal. The Man ritere otu
- LCD Soundsystem ritere otu
- Kraftwerk ritere otu
- Leonard Cohen ritere otu
- Mastodon ritere otu
- Foo Fighters ritere otu
- The National ritere otu
Jay-Z bụ onye edenyere aha ya ugboro asatọ na ndị nwere ike inwete ihe nrite nturu ugo Grammy 2018, mechara gbara aka laa.









