"O nweghi ihe gosiri na ọ bụ ndị agha ji Kanụ"- Ụlọ ikpe

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kanu na ndị otu IPOB chọrọ ka Naijiria nye ha Biafra

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja akagbuola akwụkwọ ndị ezi na ụlọ Nnamdị Kanụ na ọkaiwu ya gbara ịjị rịọ ka ọ manye onye isi agha ala Najiria bụ Tukur Buratai ka kpọpụta Kanu ebe ha dowere ya.

Jọstis Binta Nyako, bụ ọka-ikpe biri ikpe ahụ kwuru na o weghị anya etu ọnye a sị na a na-achọ achọ siri bụrụ onye gbara akwụkwọ ahụ n'ụlọ ikpe .

Ọ gara na ihu kwuo na ha gara agba akwụkwọ ahụ n' aha Kanụ, kama ị sị na ọ bụ Kanụ tinyere ya.

Kanụ, bụ onye ndu ndị otu Indigenous People of Biafra bụ IPOB n'aha ịchafụ bụ onye a na-achọ achọ kemgbe ọnwa Setemba afọ gara aga ka ndị agha gbasịrị ekwu eke na ọdịda anyanwụ ala Najiria.

Ebe ndị otu IPOB na ebo gọọmenti etiti na ndị agha ebubo na ọ bụ ha ji Kanu.

Cheta na onye nkwuchite ọnụ ha bụ Emma Powerful gwara BBC mgbe ọ na aza ajụjụ ọnụ na ọ bụ gọọment ji ya.

Ọ kwuru : "Kedụ ka ha ga-esi kweta na ha ji ya, ha mara na nwoke ahụ bụ nsogbu dịrị Naịjirịa, ha chọrọ ikpuchi ya ọnụ".