You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
E bula Metu nnukwu ụlọ ọgwụ dị na Nnewi
E bugala Olisa Metu, onye bụbu ode akwụkwọ gbasaozi ndị otu PDP na nnukwu ụlọ ọgwụ dị na Nnewi, Anambara Steeti.
E nwere egwu na ahụ ike nwa amadi ahu na-akawanye njọ mgbe aga ọsọ bute ya na nnukwu ụlọ ọgwụ,Nnamdi Azikiwe University Teaching Hospital (NAUTH),dị na Nnewi.
Cheta na Metu onye na-azara ọnụ ya ihe gbasara mpụ n'ụlọ ikpe di n' Abuja abiaghị n'ụlọ ikpe ụbọchị ịrị abụọ na abụọ nke ọnwa Jenuwarị dịka okwesịrị n'ihi ejighị ahụ ike.