Armed Forces Remembrance Day: Ka o si aga

Afọ iri anọ na asatọ agafeela kamgbe ndị agha Naịjiria na ndị agha Biafra chiliri aka elu ma kweta ịkwụsị ọgụ agha obodo (civil war) nọ na-achọ ịdọsa ndịnotu mba Naijiria.
Gọọmentị etiti Naịjiria ji maka ichili aka a, tinye ụbọchị jenụwarị iri na ise n'afọ ọbụla maka ncheta ndị nwụrụ n'agha maka Naịjiria.
Ha na-echetakwa ma ndị agha ka dị ndụ na ezinaụlọ ndị nke nwụrụ anwụ.
Ụbọchị Fraide tupu emee ncheta a, ndị alakụba na-enwe ekpere juma'at. Sụnde, ndị ụka emee ekpere n'ụlọ ụka.
Na ụbọchị mmemme ncheta, onye isi ala, osote ya, ndị dị mkpa na gọọmentị etiti na ndị isi nche dị iche iche na Naijiria ga-atụkwasị ahịhịa akpara-akpa n'ụkwụ ihe akpụrụ akpụ n'anọchite anya ndị agha nwụrụ anwụ edepụtara aha ha, n'Abuja.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Na gburugburu steeti iri atọ na isii dị na Naịjiria, ndị isi na ndị isi ndị nche ga-agbakọkwa tụkwasị ahịhịa n'ụkwụ onye agha akpụrụ akpụ, iji gosi 'onye agha a na-amaghị aha ya.
A na-agba egbe ugboro iri abụọ na otu, gba nkịtị ka otu nkeji gafee ma hapụ kpalakuku ka ọ felie, iji gosi udo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Onye isi ala ga-abịa nyochaa nche nke nsọpụrụ (guard of honour) nke ndị agha ga-edowe ebe ahụ.
Onwere akara a na-eyi n'uwe ndị gọọmentị etiti na-ewepụta; a na-ere ya were ihe erepụtara ji tinye aka ịkwado ndị agha lara ezumike nka.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3









