A nwụchiela nwoke maka inyo otele ụmụnwaanyị 550

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke n'obodo Madrid dị na mba Spen maka ebubo inyo ma see okpuru ọgọdọ ụmụnwaanyị karịrị narị ise na iri ise (555), tinye ihe onyonyo ha n'ịntanet.

Nwoke onye mba Kolombịa ahụ gbara afọ 53 ji ekwentị sere okpuru akwa ụmụnwaanyị nke o tinyere ihe onyonyo ya na websaịt na-egosi ihe mmekọrịta nwoke na nwaanyị nke nde kwuru nde mmadụ kiriri.

Ọtụtụ n'ime mmadụ 555 nwoke a nyoro ma see okpuru ha bụ ụmụaka ụmụnwaanyị etorughị etoru, bụ ndị o sere n'ụgbọala ọha.

Ọ na-esekwa ụmụnwaanyị n'ọdọahịa, ebe ụfọdụ mgbe ọ na-akọwara ndị ọ chọrọ onwe ya, iji nweta ihe onyonyo chakere ọfụma.

Mana ndị uweojii nwụchiri ya ka ọ na-ese otu nwaanyị n'ọdọ ụgbọala ọha.

Ka ha wakporo ụlọ ya ime nnyocha, ha nwetara kọmputa mkpanaka ya na igbe e ji etinye ozi nke nwere ọtụtụ ihe onyonyo.

Websaịt ya nwekwara mmadụ 3,519 na-eso ya.

Na mba spen, ichili ma nyoo ọgọdọ nwaanyị megidere iwu mmetọ nke onye dara ya nwereike ịga mkpọrọ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ụmụnwaanyị kwuputara ebumnobi ha gbasara utu nwoke na ihe ndị ọzọ.