You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Cameroon: Ndị ntọ atọọla ụmụakwụkwọ ọzọ ruru 20
Akụkọ dị mkpa
N'Afịrịka ndị ntọ atọọla ụmụ akwụkwọ iri abụọ n'ụlọakwụkwọ Lords Bilingual Dị n'obodo Kumba, nke dị na ọwụwa anyanwụ Kamerun.
BBC chọpụtara na a tọọrọ ụmụakwụkwọ a n'isi ụtụtụ taa bụ ụbọchị 20 n'ime ọnwa Nọvemba.
Ndị uweojii kwuru na ugbua ha na-eleba anya na yabụ mkpamkpa.
Onwebeghị ndị na-ekwu na ọ bụ ha mere ihe a.
Onweghị akara anyị zuru - APC
Onyeisi mgbasa ozi maka achụmnta vootu nke onyeisiala Muhammadu Buhari, bụ Festus Keyamo ekwuola na ebubo na ha zuru akara "NextLevel" ezu bụ ụgha.
Cheta na ihe na-akpọtụ na soshal midia bụ ebubo a na-ebo na APC kọpịrị akara njirimara ụlọakwụkwọ mahadum dị n'Amerịka wee mee akara ozi ịchụnta vootu ha.
Ihe mere m jiri gụọ Chizoba - Paul Okoye
Paul Okoye gwara BBC Igbo na ọ gụrụ egwu ọhụrụ ya bụ Chizoba makana ọ chọrọ ịkpalite mmọ ndị na-kwado ya.
Okoye kwuru na o tiri egwu a kamgbe otu afọ gara aga, ma kwukwa na ya bụ otiegwu nke mere na ọ ga na-agụ ihe ọbụla metụta ya n'obi.
Biko gaa nụ na websait anyị bbcigbo.com ka ịnụta ihe niile Paul gwara anyị.
Ogbunigwu egbuola mmadụ 43 na Kabul
N'ofesi, otu onye yi ogbunigwu n'ahụ egbuola onwe ya na mmadụ iri anọ na atọ ndị ọzọ n'obodo kabul na mba Afghanistan.
Ndị gbatagbata kwuru na ugbua, onweghị ndị na-ekwu na ọ bụ ha mere ihe a.
Cahill agaala ezumike nka
Tim Cahill bụ ọgba bọọlụ mba Australia agaala ezumike nka.
Cahil dị afọ iri atọ na asatọ, gbara asọmpị ya nke ikpeazu n'ime asọmpị Ọstralia na Lebanon gbara.
Ọstralia ji ọkpụ ato merie Lebanon.
Gee nkeji n'otu nkeji
Ihe nkiri
Ịkwe n'aka ofesi Naịja, Legọs
Ndị Naijiria nwere agba gụnyere; Wole Soyinka, Ike Nwachukwu, Nnia Nwodo nakwa onye okenya otu Afenifere bụ Ayo Adebanjo ekwola na o nweghị ihe ga-egbochi ihazigharị obodo Naịjirịa na mpagghara, na mpaghara.
Ha kwuru nke a na nzuko ụmụnna Aka ikenga kpokobara na Legos ụnyahụ nke a kpọrọ 'Handshake across the Niger.
PMB Ekelela ndị ụka Alakụba na Eid-El-Maulud
Onyeisiala Muhammadu Buhari ebunyela ụmụ Naijirịa ndị na-ekpe ụka Alakụba ụkpa ekele maka emume nke Eid-El-Maulud bụ ụbọchị ncheta Prọfet Muhammed.
Ọkụ agbala ụlọọrụ EFCC dị na Wuse 2, Abuja n'abalị ụnyahụ ka ọ kụchara Elekere Asaa dịka onye ọrụ ndị ụlọọrụ a bụ Kayode Oyetunde sị kwụọ.
Nrụrụ aka Richard Akindele
Ụlọikpe ukwu dị n'Osogbo atụbala ọkammụta Richard Akindele na mkpọrọ maka ikpe ịchọ ịdịna nwaakwụkwọ aha ya bụ Monica Osagie ka o were bufee ya n'ule akwụkwọ.
Supa Lig
N'egwuregwu, onyeisi ndị Uefa bụ Aleksander Ceferin na ogbo ya bụ Andrea Angnelli agọọla aka na ụkwụ na o nweghị mgbe ha ji cheta echiche iwepụta lig ọzọ a kpọrọ supa lig.