You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị nche awakpoola Ezekwesili
Ezekwesili na-ebe akwa na ha nwakporo ya
Onye bụbụ minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Oby Ezekwesili ekwuola na ndị uweojii, ndị agha na ndị DSS wakporo ya ụnyaahụ oge ọ na-eme ngagharị iwe gbasara ogbugbu ndị mmadụ mere na Platu steeti.
Ezekwesili dere n'elu twitter ya na ha wakporo ya n'ihu ụlọ obibi onyeisiala nara ya ọkọlọtọ ya.
Ha atọhapụọla Eyinnaya Abaribe
Ndị DSS atọhapụọla Abaribe bụ onye ha ji kemgbe abali Juun 15 gara aga n'okpuru ihe ndị Bekee kpọrọ Administrative bail.
Onye mgbasaozi ya bụ Uche Awọm gwara BBC Igbo na Abaribe ga-alaghachị ọrụ taa.
Ndị ọchịehi ji egbe egbuola ndị agha abụọ n'obodo Goma n'ime Benue steeti
Akụkọ kwuru na ha wakporo ha oge ha na-achọ onye gwuru nnukwu olulu n'ọkpọrọ ụzọ n'ime obodo ahụ.
Grace Mugabe chọrọ igbu m - Mnangagwa
N'Afrika, Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa kwuru na ya na-eche na nwuye onye chiburu ala ha bụ Grace Mugabe chọrọ igbu ya.
Mnangagwa na-ebo otu nwunye Mugabe na ha tụrụ ogbunigwe gburu mmadụ abuọ ma meruo mmadụ iri anọ ndị ọzo ahụ.
Obi agbawaala ndị Naịjirịa
N'egwuregwu Umu Naijiria na-ebe akwa na social media na ha gbapuola Naịjirịa n'asọmpi Iko mabụwa.
Mana onye nkuzi ha bụ Gernot Rohr na-enwe olile anya na ha ga-eme karịa n'afọ 2022 na Kata.
Gee nkeji anyị n'ụtụtụ a